VAT to 7.2%: Etụ Naijirịa si nabata mbuli ụgwọ VAT na soshal midia

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọọmentị etiti amanyela mbuli ụgwọ ụtụ isi a na-atụ n'ahịa azụrụ nke Bekee kpọrọ 'Value added tax,' VAT n'aha ịchafụ n'ụbọchị Wenezde.

Ọnọdọ ọhụrụ ụgwọ ahụ nọzi na ya bụ pasentị 7.2 site na pasentị 5 ọ bụ na mbụ.

Nke a emeela n'ụfọdụ ụmụ Naịjirịa malitere igosi iwe ha nakwa ịkatọ gọọmentị etiti n'elu soshal midia.

Iji ma atụ, Wale Adetona na-ekwu na gọọmentị etiti akwụbeghị ụgwọ opekata mpe na-amanye ego ụtụisi.

Musty Barde kwenyere na ihe Adetona kwuru

Pecky kwukwara na mbuli a agaghị adịrị ndị na-azụ ahịa mma

Olawale kwuru na Gọọmentị etiti kwesiri ịpụta kọwara ndị mmadụ etu mbuli a ga-esi bara Naịjirịa uru.

Kator kwuru na ọ bụ ihe ihere na gọọmentị etiti chọrọ ibuli ụgwọ VAT ebe ha amanyebeghị mbuli ụgwọ ezumike nka.

Mana Minista na-ahụ maka nhazi na mmefu ego bụ Zainab Ahmed kọwara na ego ga-apụta na ya bụ mbuli ga-enye aka wulite akpaego obodo.

O kwukwara na a ga-ebu ụzọ nyocha iwu gbasara VAT ahụ tupu ha amanye mbuli pasentị 7.2 dịka gọọmentị si kwado.

Ihe nkiri

Akụkọ ndị ga-amasị