You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Xenophobia: Ụmụ Naịjirịa 187 gbara ọsọ ndụ agaghi alaghachinwu South Africa ruo afọ 5
Ihe ruru mmadụ 187 si mba Saụt Afrịka gbaa ọsọ ndụ lọta Naịjirịa agaghị alagachinwu mba ahụ ruo afo ise.
Ụfọdụ n'ime ndị a lọtara gwara BBC na ụlọọrụ na-ahụ maka ndị mbịarambịa gwara ha na ọ ga-eme afọ ise tupu enye ha ohere ibata mba ahụ ọzọ.
Nke na-eme ka ndị Naịjirịa gunyere ụmụaka, ụmụnwaanyị na ụmụnwoke tụrụ ụkwa n'ọdọugbọelu dị na Legọs n'ime abalị Wenezde.
Njem ha na-abịa dịka mwakpo ulọahịa na ogbugbu mmadụ mere na mba ahụ butere ezigbote ịgbarụ ihu n'etiti Naịjirịa na mba Saụt Afrịka.
Ka ụgbọelu a bu mmadụ 189 daara, ndị nọ n'ime ya malitere ịgụ egwu na inwe aṅụrị ma na-egosi foto ụlọahịa ha agbara ọkụ.
Samson Aliyu bu onye na-ere akwa na mba Saụt Afrịka sị; "A gbara m ọsọ ndụ. ha gaara egbu m,"
Ọ gakwara n'ihu sị: "Ha gbara ụlọahịa m ọkụ, ihe niile."
Gọọmentị Naịjirịa si na ha na-ele anya mmadụ 600 ịlọta maka ihe a mere.
"Anyi na-eleanya mmadụ 317 mana ọ bụ 189 no n'ime ụgbọleu a lọtara," bụ ihe onye mmekọrịta ndị bi ofesi bụ Abike Dabiri-Erewa kwuru maka ụgbọelu a batara.
Ndi si Saụt Afrịka dịka so ụgbọelu Air Peace lọta.
Allen Onyema bụ onyeisi Air Peace nwetere ezigbote nkwado mgbe ọ banyere ụgbọelu ahụ bụ ndị mmadu lọta.
Ka ọ dị ugbua, Maazị Onyema bụzị aha akpụ n'ọnụ ugbua maka ihe a o mere.
Cheta na ọ bụ ụbọchị a ka e kwuru na a ga-akpọlata ụmụ Naijiria nọrọ Saụt Afrịka dịka nsogbu "xenophobia" nwụrụ ọkụ n'izu gara aga na mba Sauth Afrịka.
Ka ọ dị ka a na-enwe nsogbu na njem a, Abike dabiri Erewa kọwara ndị ntaakụkọ na ngalaba na-ahụ maka njem na mba Saụt Afrịka na-emegharị nnyocha ha mechaburu na mbụ.
"Air Peace anọrọla kemgbe ụzọ ụtụtụ mana ihe ka jichi nfepụ bụ ndị ọrụ njem si mbaga mba bụ ndị kwechiri na ha ga-emekwa nnyọcha ha merela mbụ."
O kwuru na "e nwere mmadụ 317 gụnyere ụmụ nwaanyị 83 na ụmụaka n'akwụkwụọ njem ụgbọelu maka ịlọta."
Dabiri-Erewa gara n'ihu kọwara na gọọmenti ga-akwado ndị a na-alọta site na inye ha obere ego maka njem ịla ebe ha si nakwa obere ego iji bido obere ahịa.