Lagos state: Aka ndị okada 123 si Jigawa bata Lagos dị ọcha - Ndi Uweojii

Ndị ọkada a nwụchiri

Ebe foto si, Twitter/Lagos state govt

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii nke Legos steeti ekwuola na ha enyochaala mmadụ 123 sitere Jigawa bata Legos ma onweghị ihe dị njọ ha hụrụ.

Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ na-akowa na ndị uweojii enyefeela ndị a n'aka gọọmenti nke Legos ma na-atụ anya na gọọmentị Legọs ga-ahapụ ha.

Kama okwuru sị na mmadụ 123 a ga-eso usoro gọọmenti Legos steeti tupu ha ebido jiri ọgbatumtum ha agba ọkada.

Cheta na gọọmentị Legọs steeti ekwuola etu aka ha si kpata ọtụtụ ndị si Ugwu Awụsa wụbanye obodo ha.

Ha kwuru na ha nwụchiri mmadụ 123 kwuru na ha bụ ndị ọkada, ka ha ji ụgbọala gwongworo buru ọkada 48, bata na Legọs.

Otu onye n'ime ndị a nwụchiri kpọrọ onwe ya Shuaibu Haruna, kwuru na ọ hapụrụ nwunye ya na nwa ya nwoke na Jigawa, bịa Legọs ka o jiri ọkada ya kpatanwuo akụ o ji elekọta ezinaụlọ ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Dịka gọọmentị Legọs steeti si kwuo n'elu Twitter ha, ọ bụ ndị mmadụ gbaara ha ama dịka ha kwuru na agwa ha nọ na-akpa n'ime ụgbọala ahụ bu ha edochaghị ha anya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọkwọụgbọ bu ha na gwongworo ahụ kọwara etu e si kwụọ ya ụgwọ ka o buru ha bute Oshodi dị na Legọs.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Mana ka a gbachara ha ajụjụ ọnụ, enweghi ihe a chọtara n'aka ha.

Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na ihe gbasara mmiri nke steeti ahụ bụ Tunji Bello nakwa kọmishọna na-ahụ maka njem bụ Abimbola Oladehinde so kpaa nkata e ji nwụchie ha.

Akụkọ ga-amasị gị: