You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abia workers salary: Onweghi ngagharịiwe anyị chọrọ ime - Onyeisi NLC
Onyeisioche otu jikọtara ndị ọrụ n'Abia Steeti bụ Uchenna Obigwe ekwuola na onweghi mgbe ndị ọrụ ji chọ ime ngagharịiwe.
Obigwe gwara BBC Igbo na ọ bụ ịgba arụkwaghịm ka ha chọrọ ime ma ọ bụrụ na gọọmentị Abia agbaghị mbọ kwụọ ndị ọrụ ụgwọ.
Ọ sị na gọvanọ Okezie Ikpeazụ kpọrọ ndịisi ọrụ oku na Fraịde 16 Ọgọst, 2019, maka etu a ga-eji kwụọ ndị ọrụ ụgwọ bụ ebe ha nọ hiwe kọmitii ga-ahụ maka nke a.
O kwuru na ndị so na komitii a gụnyere ndị ọrụ gọọmentị nakwa ndịisi otu jikọtara ndị ọrụ bụ ndị edurula n'iyi ọrụ ugbua.
Obigwe gara n'ihu kwuo na e nyere ndị a ụbọchị iri anọ iji wepụta akụkọ ihe mere ma nye ya gọomentị Abia Steeti.
Ọ bụrụ na gọọmentị nyocha atụmatụ ndị kọmitii ahụ, a na-atụ anya na ha ga-amalite kwụwa ndị ọrụ ụgwọ.
Ọ gara n'ihu kwuo na onye ọbụla chọrọ ime ngagharịiwe na-eme ya na nke onwe ya "Ihe onye ahụ kotere ya e buru."
Obigwe sịrị na ihe bụ iwe ndị ọrụ bụ ụgwọ e ji ndị lara ezumike nka, ụgwọ e ji ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Praịmarị na Sekọndịrị.
Ndị ọzọ bụ ụgwọ e ji ndị ngalaba ọrụ dị icheiche (Agencies) na ụgwọ mbuli n'ọrụ ndị ọrụ.
Mana otu onye ọrụ bekee n'Abia Steeti na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC na ndị ọrụ nwere nkwekọrịta ime ngagharịiwe.
Gọọmentị Abia Steeti kwuru na ọ bụ ndị omekaome na-achọ ịhazi na ime ngaghrịiwe n'aha ndị ọrụ Bekee.
Kọmishịọna na-ahụ maka mgbasaozi bụ John Okiyi kwuru na ndị ọrụ nchekwa dị njikere ịnwụchi ndị dị otu a.
Cheta na akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na ndị ọrụ n'Abia Steeti na-achọ ime ngagharịiwe maka ụgwọ gọọmentị ji ha.