You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abia Teachers Strike: Ụgwọ gọometị ji anyị karịrị akarị
Ọ bụzịghị ihe akụkọ na ụlọakwụkwọ ndị gọọmentị nwere n'Abia Steeti gbachiri agbachi kemgbe izuụka abụọ gara aga.
Ọ bụ maka abụbụọrụ ndị nkuzi na-agba n'ihi ụgwọ ọnwa iri ha sị na gọọmentị ji ha nakwa ihe ndị ọzọ.
Onyeisi otu jikọrọ ndị ọrụ n'Abia bụ Uchenna Obigwe kwuru na gọọmentị ekwela ndị nkuzi nkwa ịkwụ ụgwọ ọnwa abụọ.
Mana nkwa a emeghị ka ndị nkuzi laghachị n'ụlọakwụkwọ dịka ụfọdụ ha ka na-ewe iwe banyere nke a.
Onyeisi ndị nkuzi n'Aba-North bụ Njoku C.C gwara BBC Igbo na o nweela ndị nkụzi natarala ụgwọnwa abụọ, ụfọdụ ọnwa atọ.
Mana ndị nkuzi gba gburugburu anabataghị ụgwọọnwa atọ gọọmentị chọrọ ịkwụ n'ime ọnwa iri e ji ha n'ụgwọ.
Njoku kwuru na ha na gọọmentị zutere mana ndị nkuzi Abia Steeti gbaa gburugburu ekweghi na mpụtara mkparịtaụka ahụ.
Kedụ ihe bụ iwe ndị nkuzi a?
Njoku C.C sị na ihe ndị nkuzi chọrọ ka gọọmentị Abia Steeti mee tupu ha amalite ọrụ gụnyere;
1. Ịkwụcha ndị nkuzi ụgwọọnwa iri eji ha
2. Ịkwụ ndị nkuzi ụgwọ ezumike ọrụ akpọrọ 'Leave Allowance'
3. Ịkwụ ndị nkuzi ụgwọ mbuli n'ọkwa bụ 'Salary Upgrade'
4. Ịkwụ ndị nkuzi Praịmarị ụgwọ 'Teachers Salary Subsidy'.
Otu onye nkuzi Sekọndịrị bụ Anusionwu O. gwara BBC Igbo na akwụghị ụgwọọnwa metụtara ya n'ụzọ dị iche iche.
Nke bụ na ego e ji elekọta ezinaụlọ adịghị, na mgbe ụfọdụ, ọ na-abọrọ ndị mmadụ ahịhịa, buoru ndị mmadụ ibu iji hụ ihe a na-eri.
Mbọ niile BBC Igbo gbara inweta gọọmentị Abia Steeti site n'aka onye enyemaka mgbasaozi gọvanọ bụ Onyebuchi Ememanka amịtaghị mkpụrụ.
Dịka na ọ zaghị ekwentị ya n'oge a kpọrọ ya.