You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
AMCON Debtors List: 'Ihe mere aha anyị ji dị na ndị ji gọọmenti ụgwọ'
Onyeisiala Naijịrịa bụ Muhammadu Buhari agbanweela iwu nke nyeziri ngalaba n'ahụ maka igba ụgwọ ikike i gwa ndị ụlọakụ ka ha nye ha ohere inyocha obaego ndị niile ji gọọmentị ugwọ.
Ngalaba gọọmentị ndịa bụ Asset Management Corporation of Nigeria (AMCON) , Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), Nigerian Financial Intelligence Unit (NFIU) na kwa Independent Corrupt Practices Commission (ICPC) .
Gọọmentị na agba mbo inatacha ụgwọ eji AMCON mana iwu ochie nke agbanwere ugbua enyeghị ha ikike ha chọrọ.
Mana ka ọ dị ụgbụ a, ha enwtala ikike ha chọrọ.
AMCON edepụtala akwụkwọ na mbụ nke gosịrị aha ndị jị ha ụgwọ, BBC gbara otu n'ime ha ajụjụ ka ọ gwa anyị uche ya.
Ugo Egboji - Petrologistics Limited
Ugo Egboji onyeisi ụlọọrụ Petrologistics gwara BBC otu iwu ọhụru a sịrị metuta ya.
O mere ka anyị ghọta na:
1) "Ụgwọ a e ji bụ ụgwọ e ji ndị ụlọakụ"
2) "Ọtụtụ ụgwọ a bụ nke sitere na mgbere akụ ụlọọrụ na-ere mmanụ agbidi nke a gbara n' ụlọ mgbere ahịa a kpọrọ "Stock Market."
3) "Dịka Naịjirịa nwere ọtanisi(Recession) n'afọ 2008 nke metụtara ọtụtụ ụlọọrụ, gọomentị kwesiri ili ụlọọrụ ndị a, ihe Bekee kpọrọ 'Liquidation," dịka a na-eme na mba ndị ọzọ."
"Mana ha emeghị ya n'ihi na gọọmentị achọghị ka ụlọakụ ga daa."
4) "Ndị ji ụgwọ a karịrị puku ise"
5) "AMCON na-eme ka ọ dịrị gọọmentị mma, ọ dịrị ụloakụ mma ma dịkwara ndị ji ụgwọ mma."
6) "N'agbanyeghị nke a, e nwere ndị na-achọghị ikwu ụgwọ a ma ncha."
7) "Aha e deputara na Intanetị nsonso a bụ ọrụ ndi ntaakụkọ umengwụ n'ihi na aha ndị a bụ aha ochie e depụtara."
8) "E depụta aha ndị ji ụgwọ ọhụrụ i ga ahụ na ọbụghị aha niile ka i ga ahụ na ya."
Dika ihe a si gbasata iwu, Okaiwu bụ Nwabufo Ikechukwu kọwara na ọ bụghi nani onyeisiala denyere atụmatu a n'iwu, kama ndị Omeiwu ga eweputa iwu tupu onyeisiala edenye ya n'iwu Naịjiria.
Nwabufo gara n'ihu kọwaa kwa na iwu a bụ ndezighari iwu AMCON nke di bụ mbụ.
O gara n'ihu kọwaa na tupu edegharia iwu a, ndi gọomenti enweghi ikike igwa ndi uloakụ ka ha nye ha ohere i nyocha ma banye obaego ndia ji ụgwọ.
O kwuru na iwu ọhụrụ a ga enyezi ndị gọọmenti ikike inyocha obaego ndia ji ugwọ na enweghi mgbochi obụla dika iwu ochie AMCON na egbochi ha.
Nwabufo gwara BBC na n'uche obi ya, iwu a bụ ezigbote ihe, kama ka a n'ele ma ọ bụ otu nri si esi ka ọ ga esi tọọ.
Lee Akụko Ga-Amasị Gị -
Lee Ihe Nkịrị Ga-Amasị Gị -