You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Senator Utazi: Ihe mere m ji hapụ ike akụrụngwa 'Constituency Project' mgbe o kwesịrị
Omeiwu na-anọchịte anya Enugwu Nọt bụ Godfrey Chukwuka Utazi azarala ọnụ ya maka ebubo ngalaba na-ahụ maka nrụrụka na mpụ bụ Independent Corrupt Practices Commission (ICPC) boro ya.
ICPC kpọchiri be Utazi n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọstụ, ma bo ya ebubo na o buuru akụrụngwa gọọmentị so n'ihe Bekee kpọrọ "Consistuency Project", dowe na be ya ghara ikenye ya ndị mmadụ etu o kwesịrị.
ICPC gakwara n'ihu gosi foto ha sị si be Utazi, nke ha sị na-egosi akwụrụngwa ndị a.
Ka ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ na ya bụ foto na ebubo ndị ICPC, akụkọ ọzọ pụta na Sinetọ Utazi amalitela ike ya bụ akụrụngwa.
BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ maka ebubo a.
Sinetọ Utazi malitere okwu na ịsị na ọ bụ ndị iro na-agba ya mgba okpuru butere okwu a.
Ọ sị na nke a bụ ugboro atọ ọ ga-eme atụmatụ "Consistuency Project" kemgbe ọ banyere ọkwa dịka onye omeiwu.
"Ihe mere na m ekeghi nke a n'afọ gara aga bụ na m chọrọ ike ya mgbe ezumike m. Achọghịkwa m ike ya mgbe ndọrọndọrọ ka ndị mmadụ ghara iwe ya na m chọrọ iji ya zọta vootu."
Sinetọ Utazi gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị nwere ọrụsị ka ha na-ekenye ha bụ akụrụngwa.
"Anyị malitere ike ya kemgbe Tusde. Ọ ga-ebi na Monde na-abịa."
Osita Enwe bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye Enugwu Nọt gwara BBC Igbo na ya bụ okwu bụ ihe ekwesịrị ime nnyocha ọfụma makana akụrụngwa a na-ekwu okwu ya bụ ego gọọmentị ka e ji gote ya.
"Anyị nụrụ na ICPC kpachiri ụlọ ya, ma nụkwa na ọ na-ekezi ihe a hụrụ na be ya. Ọ bụ ihe mgbagwoju anya. makana etu o si eke ugbua nwereike ịbụ oke na-agba ọsọ makana ọkụ na-agba."
BBC Igbo jụrụ Sinetọ Utazi ma ọ bụ ICPC manyere ya ike akụrụngwa a.
Ọ jụrụ: "Ọ bụ ICPC manyere m ike nke afọ gara aga, kaọbụ nke anyị kere n'Epụrel?"
BBC Igbo gbakwara mbọ ịnụta n'ọnụ ICPC mana ekwentị ha agaghị.
Enweghikwanụ ihe ha dere maka okike akụrụngwa n'akara soshal midia ha maọbụ na webụsaịtị ha.
Gee ihe Sinetọ Utazi kwuru n'uju n'elu.