You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Coal Camp Enugu enwelitala ọnọdụ njirimara ha
Otu n'ime omenala njirimara Igbo bụ iti mmọnwụ.
Coal Camp Enugwu sọ na ndị eji mmọnwụ mara.
Mgbe gboo, Coal Camp so na ebe a na-abịa ekiri mmọnwụ dị icheiche ma emewe emume.
Agbawa ihe dịka ekeresimesi, emume afọ ọhụrụ maọbụ Easter, Coal Camp na ejueju bara abara na mmọnwụ.
Mana omenala a mechere lawa nke bụ na anaghịkwa ahụ mmọnwụ ọbụla ma emewe emume na Coal Camp maọbụ Enugwu gbaa gburugburu.
Ugbua, ndị Coal Camp tetere n'ụra kpebie ịmalịte ya bụ omenala njirimara ha. Nke mbụ ya ka ị ga ekiri ebe a.