Precious Owolabi: Ihe 'Channels' kwuru maka ọnwụ Precious

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ Channels Television ekwuola na Precious Owolabi onye bịara ife ala nna ya (NYSC) bụ nduje ka o dujere onyentakụkọ ha gara ime isete ngaghariwe ndị shiites n'ụbọchị Mọndei.

Kingsley Uranta bụ onye so na ndị isi ụlọọrụ ahụ gwara BBC Igbo na ọ bụ mgbọ tụgburu Owolabi mgbe ndị Shiite na-eme ngaghariwe.

BBC Igbo jụrụ ya ma ụlọọrụ ha enyekwara onye ntakụkọ ahụ ọzụzụ zuruoke maka ị gaa isetee ụdịri akụkọ yiri nke ngagharịiwe Shiites, Uranta kwuru na ọ bụ ya na onye ntakụkọ ha kwụ gaa.

Anyị jụkwara ya ma Owolabi na onye ntaakụkọ ha eyikwa uwe nchekwa ndị ntakụkọ na-eyi were gaa isete ya bụ akụkọ , Uranta kwuru na ọ gaghị azali ajụjụ ahụ ugbua.

Ekwenti nyụrụ ka ọ na-aza anyị ajụjụ ndị a mana ọ kpọghachiri kwuo na ọ gaghị azachịghali anyị ajụjụ niile a kama ọ ga-ebipute akwụkwọ ozi ihe ụlọọrụ Channels nwere ikwu gbasara ọnwụ Owolabi.

Ụgboro ole ka ndị ntaakụkọ Channels bara n'ọdachị n'ebe ha na-esete akụkọ?

Enenche Akogwu bụ onye ntaakụkọ ha nwụrụ n'ọgbaghara dapụtara na Kano n'afọ 2012.

Ndị ọra ọbara were mma sụgbuo Charles Erukaa mgbe ọ gara isete ọsọ nta vootu pati APC na Rivers state n'afọ 2015.

Etu ọ dị ugbua onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala ndị ezinụlọ Precious Owolabi nakwa onye uweojii Usman Umar nwụrụ n'ọdachị ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: