You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Precious Owolabi: Ọgụ shịịte ataala isi onye ntaakụkọ Channels
Nwa okorobia na-efe ala nna ya n'ụlọọrụ mgbasaozi "Channels" anwụọla n'ọgụ dapụtara n'etiti ndị uweojii na ndị Shiite.
Precious nwụrụ mgbe mgbọ egbe a na-agba tụrụ ya oge ọ na-esete ọgụ ahụ na Abuja.
Ụlọọrụ Channels egosipụtala obi mgbawa ha gbasara ya bụ ọnwụ onye ntaakụkọ ha chere ga-eme ọfụma n'ọdịnihu.
Ha na-arịọ ka Chukwu nara mkpuru obi ya na ndokwa.
Mana ụmụ Naịjirịa nọ n'elu soshal midia ne-ekwu uche ha kamgbe ọ nwụchara.
@EmmanuelNgwaogu gosiri nwute ya.
@MoghaluKingsley kwuru na onyeisiala Buhari kwesiri ka iwe otu dị iche iche na Naịjirịa na-eme ngagharị iwe dajụọ.
@thestatewriter kwuru na ọ maghị iher mere ndị ọchịchị Naịjirịa jiri gbachị nkịtị a na-akwafu ọbara ụmụ Naịjirịa na-eme ọfụma.
@cchukudebelu kwuru na ndụ ụmụ Naịjirịa adịghị ndị nọ n'ọchịchị mkpa.