'Nne m agwaghị m na m nwere HIV tupu ọ nwụọ'

Brian Omondi
Nkọwa foto, Brian Omondi sị na ọ na-ara onye nwere ọrịa HIV inwe mmekọrịta na Kenya

Ọtụtụ nne na nna na Kenya na-ezochi ọnọdụ HIV ha ruo n'ili, ụmụ ha agaghị ama.

Brian Omondi so n'otu ndí nwere HIV kemgbe a mụrụ ya, o bidoro ịṅụ ọgwụ HIV Bekee kpọrọ "Anti-Retroviral" (ARV) mgbe o ruru afọ iri.

Ọ bụ ka nne ya nwụrụ mgbe o ruru afọ iri na anọ ka ọ ghọtara ụdị ọgwụ ọ na-aṅụ.

Ugbua, o ruola afọ iri abụọ na abụọ, o so ndị bu agha HIV n'isi.

Ọ na-eso ndị ụlọụka na-arụ ọrụ, ọ sị na ọ maghị ọnọdụ ya mgbe a mụrụ ya.

Mgbe ọ ka pere mpe n'obodo Mombasa, o chetara na o nwere etu ahụ si eme ya:

"Mgbe niile ka ahụ na-arịa m mana o nweghi mgbe ọ na-arịa m n'ike, ka nne m ji gwaa m ka m gaa mee nnyocha"

"Ọ bụ mgbe nnyocha m mere gosipụtara na m nwere HIV, m bido na-aṅụ ọgwụ ya mana nne m agwaghị m ihe mere m ji aṅụ ọgwụ ahụ."

Onye na-akuzi maka ọrịa ahụ.

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụ mgbe ọ gara na nke nwanne nne ya ka nne ya nwụrụ ka ndị agbataobi n'obodo matara ọnọdụ HIV ya wee bido na-akparị ya.

Ndị nne na nna na-achụ ụmụ ha iso ya egwu egwu maka na o nwere HIV.

"Echetara m mgbe otu nwa ụlọakwụkwọ anyị hụrụ m na mmadụ wee gwa m sị "Gị bụ onye nwere HIV".

"Nke a wutere m."

Ọgwụ abalị

Nwa ntakịrị

Ebe foto si, Getty Images

N' agbanyeghi na ọtụtụ ụmụ ntoroọbịa so na ndị a gụnyere nwere HIV na Kenya na Sahara Afrịka.

Ndị kachasị bụ ndị nwere ọrịa mgbe a mụrụ ha ma na-ebinwu ndụ ha.