HIV cure: A maala ụkọchukwu sị na ọ na-agwọ nje HIV ikpe

Ebe foto si, Walter Magaya/Facebook
A maala otu onye ụkọchukwu bụ Walter Magaya ikpemaka ịre ọgwụ adịgboroja o kwuru na-agwọ nje HIV na mba Zimbabwe
Dịka ọ dị ugbua a na-eche ka amara afọ ole ụlọikpe ga-ekwu n'ọ ga-anọ n'ụlọmkpọrọ.
Walter Magaya bụ ụkọchukwu ama ama na mba ahụ.
Ọzọ,
Otu Ipob asaala ndị agha Naijiria ihe ha kwuru maka iche ndị Ipob aka mgba n'oge ntuliaka na-abịa.
Ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Chuwkwudi Peace kwuru na mmaja a bụ ụzọ ndị agha si chọọ wakpo ma gbuo Ndigbo ọzọ na ntuliaka.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Esha Gupta bụ onye ihe nkiri mba India kparịrị Alex Iwobi n'izu gara aga akwụkwọ ozi iji rịọ ya mgbaghara.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achịkọtabu otu Manchester United bu Jose Mourninho ekwetaala na ọ ga-aga nga dịka akpụpụrụ ya ụlọikpe maka ịgbalahụ ụgwọ ụtụ isi na mba Spen.
Mana gọọmentị spen ekwela ị nara ya ego ka ọ ghara ị ga ụlọmkpọrọ.
Akụkọ BBC na nkeji











