UK Home office akpaliela iwe ụmụ Naijiria n'okwu ịgba akwụna

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụmụ mmadụ awụọla UK Home office ọnụ maka ikwu na ụmụagbọghọ e si Naịjirịa gbaa mgbere kpọga ofesi na-alọghachi n'ala ha dịka 'ọgaranya a na-akwanyere 'ugwu.'

Ụlọọrụ ahụ kwuru n'akwụkwọ ntuziaka ha na "Ụmụnwaanyị atụgara mgbere na Yurop' na-aba ọgaranya site n'ọrụ akwụna.

Kwuo kwa na ha bụ ndị ọnụ na-eru n'okwu, na-enweghi ndị na-eleda ha anya n'ihi na ha a kpatala ego."

Ya bụ okwu kusuru ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ụmụ Naịjirịa nọ na mba Briten bụ ndị tụnyere ọnụ n'okwu ahụ.

Ozoemena Nonso Eze kwuru na ịgbe mgbere ụmụnwaanyị kpọga ala bekee bụ 'ịgba ohu nke agba ọhụrụ.'

Na nkọwa ya, Eze kwuru na ọtụtụ ụmụagbọghọ ndị a na-anọ n'ahụhụ afọ 10 rue 15 iji kwụọ ndị kpọtara ha alabekee ụgwọ.

"O nweghi ego ọbụla ha na-akpata kama ọ bụ ndị ji ha agba mgbere na-enwe ego."

Sarah Champion sị na okwu ahụ adabaghị.

Kate Osamor bụ onye omeiwu na mba UK sị na Home Office amagheghi ahụhụ ụmụagbọghọ ahụ na-ata wee kwuo ụdị okwu ahụ.

Mana otu ọnụ na-ekwuru 'Home Office' kwuru na ha ga-elebanye okwu ahụ anya iji degharịa ya.'

Akụkọ ndị ga-amasị gị: