Baby India: Ọtụtụ ezinaụlọ egosila mmasị ikuchi nwatakịrị nne ya mụrụ tufuo
Ọtụtụ ezinaụlọ n'akụkụ ụwa niile kwụ na ọgbara na-eche ka ha kuchie nwatakịrị nwaanyị ndị uweojii mba Amerịka kwuru na ha chọtara ya ebe atufuru ya atufu na mpaghara Georgia.
Ndị uweojii kọwara na ọ bụ ndị bi n'okirkiri ebe ahụ nụrụ ka nwata ahụ na-ebe akwa ha wee kpọọ ha ka ha bịa kuru ya. A gụrụ nwata ahụ 'Baby India'.
Ha kuuru nwata ahụ gaa ụlọọgwụ mana ndị dokịnta kwuru na ahụ siri ya ike.
Ka izu atọ gachara, akụkọ kwuru na 'Baby India' ka gbasiri ike na-amụrị amụ n'ụlọ ebe a na-elekọta ụmụaka ebe edotere ya.
Ọ ga-anọgide ebe ahụ wee ruo mgbe a ga-ahọpụta ndị ga-azuwazi ya dika nne na nna ya.
Onyeisi ndị uweojii nke ime obodo Forsyth aha ya bụ Ron Freeman kwuru na a matabeghi onye bụ nne nwata ahụ maọbụ ndị agbataobi ya.

Ebe foto si, EPA
N'akara Facebook ha, ndị ọchịchị Forsyth kwuru na ha enweghi ozi ohụrụ ọzọ ha ga-ezi gbasara 'Baby India'.
Mana Tom Rawlings bụ onye isi "Georgia Division of Family and Children Services" kwuru na ọtụtụ ezinaụlọ egosila mmasị ikuchi nwata ahụ.
Rawlings kwuru nke a n'ihe onyonyo ndị ABC TV akpọrọ "Good Morning America Show".

Ebe foto si, Reuters
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ nnukwu ọrụ ebube na nwata ahụ ka dị ndụ mgbe ndị mmadụ hụrụ ya tupu ha akpọọ ndị uwe ojii.
Mgbe achọtara 'Baby India' n'ime obodo Forsyth nke di na mpaghara ugwu Atlanta, Georgia, eriri otubo ya ka di ya n'ahụ nke gosiri na omebeghi elekere olemole amụpụtara ya.
Akụkọ ga amasị gi:











