You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Wole Soyinka: Okwu 'pụọ n'oche m' ekotela ebu
Okwu gbasara Wole Soyinka bụ ode akwụkwọ ama ama amụtaala ọtụtụ okwu.
Ka anya hụrụ ihe a merenụ bụ Tonye Patrick Cole depụtachara ya na twitter, ndị mmadụ were ya bụ akụkọ kọrọ gawa.
Nke kacha tinye okwu n'ọnụ ụmụ Naịjirịa bụ na otu nwokorọbia kpọrọ onwe ya Tosin Odunfa apụtala kwuo na ọ bụ ya gwara Soyinka ka o biliere ya n'oche n'ụgbọelu.
Mana ọtụtụ mmadụ na-ekwu na onye ya na Soyinka nọ n'ụgbọelu ahụ abụghị Odunfa.
@UchenduVictor5 kwuru na onye a kpọrọ onwe ya Tosin Odunfa bụ onye ụgha.
@mcgboye kwuru na akụkọ Odunfa bụ okpotokpo asị.
Ihe ndị mmadụ ka na-ajụ bụ, kedụ ka mmadụ si amabanye n'akụkọ na-agbasaghị ya ma tụọ asị na ọ bụ ya ka ihe metụtara.
Cheta na ọ bụ Tonye Cole bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị depụtara ihe mere n'ụgbọelu ahụ n'akara Instagram ya ma na-akara twitter ma na-akatọ ihe nwokoroọbia ahụ mere dịka agwa ọjọ.
Ụfọdụ mmadụ kwunyere ya
Mo Abudu bụ onye ama ama n'ihe nkiri kwuru na agwa ahụ ajọka.
Ebe K8henshaw katọkwara ya bụ agwa nwaokoroọbia a kpara.
@realFFK kwuru na hoha nwaokoroọbia ahụ akwanyereghị Soyinka ugwu.
Ụfọdụ ndị ntoroọbịa nọ n'elu twitter wee were ọkụ chinyere ndị a katọrọ agwa nwaokoroọbia ahụ
@wonka_ng kwuru na nwokorobia ahụ mere ọfụma site n'ikwu ka Soyinka kulie n'oche ya.
@YemieFASH juru ma Soyinka a ga-anọdụli n'oche na bughị nke ya ụgbọelu dị mba Amerịka maọbụ UK?
Ihe ndị mmadụ na-achọghị ikwụsị maka okwu a bụ ndọrọndọrọ onye ọ bụ ya kpara agwa ajọ n'etiti mmadụ abụọ a.