You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Suspension of 27 Imo LGA chairmen, councillors: 'Ihe mere anyị ji gbaa Ihedioha akwụkwọ n'ụlọikpe'
Ndị kaụnselọ 604 dị n'okpuru ọchịchị 27 a chụrụ n'ọrụ n'ike n'Imo akọwaala na ihe mere ha ji gbaa Gọvanọ Emeka ihediọha akwụkwọ n'ụlọikpe bụ n'ihi na "o megidere iwu Naijiria" site na ịchụ ha n'ọrụ."
Ndị kaụnselọ okpuru ọchịchị iri abụọ na asaa a chụdara n'ike n'Imo steeti kpụpụrụ aka na-achị gọvanọ steeti ahụ bụ Emeka Ihedioha na ndị omeiwu steeti ahụ n'ụlọikpe ukwu nke etiti nọ n'Owere.
Ha na-agbagha ọchụchụ n'ọrụ nke a chụrụ ha n'abali atọ nke ọnwa Juun afọ dịka ụlọomeiwu steeti ahụ siri kpebie ma were kọmịti nlekọta anya dochie ha.
Otu onye na ime ndị kaụnselo ọ metụtara bụ George Uke gwara BBC Igbo na ya bụ ihe bụ "ihe ụlọikpe kachasị kpebiriela dịka ha kagburu mkpebi Ụlọomeiwu nke steeti ahụ kpebiri."
Uke, onye bụ otu n'ime ndị kaụnselọ n'Okpuru Ọchịchị Ideatọ-North, sị: "Etu gọọmenti etiti enweghị ikike ịchụlị ndị a họpụtara na ntuliaka dịka ndị gọvanọ n'ọrụ, ndị gọvanọ enweghị ikike ịkwusị ndị kaụnselọ ọrụ."
Uke onye kwuru na ọ bụ n'afọ 2021 ka ha kwesiri ibi ọrụ ha, kwuru na o nweghị mgbe e nyere ha akwụkwọ na a chụrụ ha n'ọrụ.
"A chọọ ịchụ n'ọrụ, a ga enye gị akwụkwọ ga-ekwu na a chụrụ na ihe kpatara ya, mana o nweghị akwụkwọ ịchụ n'ọrụ anyị hụrụ."
"E jighị ịma ọkwa achụ mmadụ n'ọrụ."
O gara n'ihu kọwaa na ha enwetala ntuziaka ụlọikpe si ha bido ọru ganye mgbe e biri ikpe ahụ.
O kwuru na ha ihe nwere ike ibute ọgbaghara na ssteet ahụ dịka ya bụ ihe metụtara ndị APC, ebe ndị ọhụrụ bụcha ndị PDP.
"Ha chọrọ iji okwu 'suspension' meghaa ndị mmadụ anya."