You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Suspension of 27 LG Chairmen: "Emeka Ihedioha anaghị abọ ọbụbọ"
Gọọmentị Imo steeti apụtala ịzara ọnụ ha gbasara ndị okpuruọchịchị 27 a kwụsịtụrụ ọrụ n'Imo steeti taa.
Ndị ọ gbasara gụnyere ndịisioche okpuruọchịchị, ndịisi ngalaba gọọmentị na ndị ọrụ enyemaka gọọmentị ndị ọzọ.
Ọnụ na-eckwuchitere Emeka Ihedioha bụ Chibuike Onyeukwu kwuru na eleghi anya pati n'ihe mere taa.
N'ọnụ ya "Ọ bụ maka ebubo ụfọdụ eboro ndị a ka ndị nzụkọ omeiwu ochie jiri manye ya bụ iwu"
O kwukwara na a ga-eme nyocha ọfụma tupu a mara ihe a ga-eme ndị a akwụsịrị ọrụ n'ike.
"Mkpa Ihedioha bụ ileanya n'ihu na ịdozi Imo steeti n'abụghị ileghachi anya n'azụ" ka ọ gwara BBC.