NBC anapụla AIT, Ray Power ikike mgbasaozi

Akụkọ dị mkpa:

NBC anapụla AIT,Ray Power ikike mgbasaozi

Ngalaba na-ahụ maka mgbasaozi n'ikuku bụ National Broadcasting Commission(NBC) anapụla ụlọọrụ ntaakụkọ AIT, Raypower ikike mgbasaozi.

Onyeisi NBC bụ Modibbo Kawu bụ onye gbara ama nke a na mgbarịtaụka ya ndị ntakụkọ nwere n'Abuja ụbọchị Tọọzde.

O kwuru na nnapụ bụ n'ihi na ụlọọrụ ntakụkọ ahụ nupuru isis n'iwu mgbasaozi.

Ndajọ NBC bọrọ ụlọọrụ ahụ gụnyere ịgbasa ozi banyere ntuliaka onyesisiala nke bụ okwu ka dị n'ụlọikpe, akwụghị ụgwọ kwesịị ka ha kwụọ nakwa ịgbasa ozi na-akusu maọbụ bute nkewa na soshal midia."

8th Assembly:O nwere ndị chọrọ ịnapụ ọchịchị sineti- Ekweremadu

Osote onyeisi ụlọomeiwu nke asatọ bụ Ike Ekweremadu akụwaala akụoyibo Nsugbe n'okwu gbasara ihe mere oge ha n'ụlọomeiwu nke bịara na njedebe ụbọchị Juun 6,2019.

N'okwu ya n'ọgbakọ mmechi ụlọomeiwu nke asatọ nke a mere n'Abuja ụbọchị Tọọzde, Ekweremadu gbara ama na o nwere ndị chọburu 'ịkwada' ọchịchị Sineti, ma kelee ndị ogbo ya sị na ha ekweghị ngwere gbaa ajị.

"N'ime nsogbu anyị niile, anyị jịkọrọ ọnụ dịka Sineti. Anyị ma ihe anyị kwụdoro marakwanụ na ọ bụ maka ọdịmma ụmụ Naijiria ka anyị kwudoro."

"N'ezie e nwere nkata ịkwada ọchịchị Sineti n'ike a kpara mana e nwere ndị, n'agbanyeghị otu pati ha sonyere, kwudosiri ike hụ na o meghị. Ana m ekelee ha maka ikwudo n'eziokwu."

African Union achụpụla Sudan n'otu ha

Otu AU achụpụla mba Sudan n'otu ha ganye na ha hiwe otu ga-ahazi nyefee ọchịchị n'aka ndị nkịtị.

Nchụda n'ike ahụ na-esochi ogbugbu ndị nkịtị nke ndị agha ala ahụ merela n'abalị atọ gara aga.

Cheta na ọgbaghara ka ibe ya na-aga n'iru na mba Sudan kemgbe a chụdachara Onyeisiala ha bụ Omar al-Bashir n'ọnwa Eprelụ

Aka akparala Ahmad Ahmad onyeisi CAF maka ebubo nrụrụaka

Confederation of African Football(CAF) bụ otu na-achịka egwu bọọlụ n' Afrịka ekwuola n'ezie na anwụchiri onnyeisi ha bụ Ahmad Ahmad na Paris maka 'ihe gbasara nnyocha ọkwa ya dịka onyeisi Caf." maka ghị ihe ọbụla maka kepukepu na ndị uweojii nwụchiri onyeisi ha bụ Ahmad Ahmad maka ebubo nrụrụaka.

Ha kwuru na "Fifa amaghị kpọmkwem ihe gbasara nnyocha ahụ, ya mere na ha enweghị ike ikwu ihe ọ bụla banyere okwu ahụ."

Gee akụkọ ndị a ebe:

Ndị dịbịa Bekee n'Imo Steeti atụgharịala uche maka abụbụ ọrụ ha gbara kemgbe ọnwa Eprelu

Ndị dịbịa a na-ewe iwe maka ụgwọ ọnwa a na-akwụzughị ha, sị na aka ọhụrụ na-achị steeti ahụ bụ Emeka Ihedioha ekwela nkwa imezu nkwekọrịta ha na gọọmentị pụrụapụ nwere.

Onyeisi otu jikọtara ndị dọkịnta n'Imo bụ Kyrian Duruewuru kwuru na ha akwụsịla abụbụọrụ ha gbara n'egbughi oge dịka ha na gọvanọ hụchara.

O kwuru na gọvanọ Ihedioha sị na ọ ga-akwụ ha ụgwọ ọnwa atọ nke gara aga n'otu ugboro.

Abubakar Shekau apụtala ọzọ

Onyeisi ndị omekome Boko Haram bụ Abubakar Shekau esepụtakwala isi ya ọzọ.

Shekau katọrọ atụmatụ ọchịchị onye kwuo uche ya n'ime ihe onyonyo ọhụrụ

Ihe onyonyo a pụtara ka ndị Islamic State na-eto na ha gburu ndi agha na mpaghara Lake Chad

Na Kano

Gọọmentị Kano Steeti sị na ihe mere ha ji kagbuo emume egwuruegwu inyinya akpọrọ 'Durban Festival' eji mara steeti ahụ bụ maka ichekwa ndụ ọha n'ihi ndị oji egbe wakporo ebe a na-eme emume a.

N'Ofesi

Mba Sudan na-agọ na mmadụ narị nwụrụ mgbe ndị agha wakporo ndị na-eme ngagharị iwe. Mana, ha kwetere na mmadụ iri anọ na isii nwụrụ na ya bụ ọgbaghara.

N'egwuregwu

Cristiano Ronaldo bu onye akpụ n'ọnụ ụnyaahụ mgbe Pọtụgal na Swizaland zutere na Ikp akpọrọ UEFA Nations League.

Ronaldo dọkara nkata ugbolo atọ n'a asọmpị ahụ Pọtụgal ji ọkpụ atọ asatara ọtụ gbacha.

Nkeji

Ihe nkiri