Ihedioha Vs Okorocha: Ụjọ nnyocha adịghị atụ m - Rochas

Onye chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha ekwuola na ụjọ ọbụla anaghị atụ ya banyere nnyocha nke Emeka Ihedioha bụ onye na-achị Imo ugbua sị na ya ga-enyocha ọchịchị ya.

Ọnụ onye na-ekwuchitere ya bụ Ebere Nzewuji kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwentị ụbọchị Wenezdee.

N'ụbọchị Tuzdee, Ihedioha kwuru na ya ga-enyocha ndị ọchịchị Imo steeti garala aga ma gbaa nke ọbụla n'ime ha zuru ego steeti ahụ n'anwụ.

O kwuru nke a na mbido ọgbakọ ndị omeiwu Imo steeti nwere n'Oguta.

Ihedioha kwuru: "Aga m akpọ ndị orụ nchekwa dị iche iche ka ha nyochaa ndị nile chịburu steeti a."

Onye ọbụla n'ime ha mere nrụrụaka ga-agbọ ihe o riri.

Mana Okorocha site n'ọnụ Nzewuji gwara BBC na ihe dịrị Ihedioha ugbua bu ịgba mbọ ịhụ na ọ rụrụ orụ ya nke ọma dịka gọvanọ karịa ị na-agagharị na-akọtọ aha Okorocha.

"Uwa nile ma nke oma na o nwebeghi gọvanọ n'Imo steeti rụrụ ọrụ dịka anyị si rụọ. "

Okorocha onye kwuru na Ihedioha na-eme nke a iji kpasasị ndị mmadụ anya n'ihe o kwesịrị i mere ndị Imo,sịrị, "Ihedioha kwesiri ịgbado anya mara ma ọ ga-arunwu ọkara ihe Okorocha rụrụ n'Imo steeti."

O kwukwara na ọ baghị uru izaghachi Ihedioha na-ebubo ọ na-ebo Okorocha, tụmadị nke ọ sịrị na Okorocha ahafeghị ya ọchịchị n'aka nke oma.

"Ihe ndị ahụ nile bụcha asị asị."

O siri ọnwụ na-ekwu Okorocha hafere Ihedioha ihe nile ga-adị ya mkpa n'ọrụ ya dịka gọvanọ.

Akụkọ ga-amasị gị: