8th Assembly: Ihe ise a ga-eji cheta Ụlọ omeiwu nke asato

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Dika ụlọ omeiwu nke asatọ ga-abịa n'isi njedebe taa bụ Tọọzdee abalị isii nke ọnwa Juun, 2019, ka anyị leghachị anya n'ihe olemole ndị megasịrịnu na ya bụ ụlọ omeiwu nke ekwesiri ncheta.

1. Iwu kachasị n'ọnụọgụgụ

Ụlọ omeiwu nke asatọ bụ nke ọnụọgụgụ iwu ha mepụtarala kachasị kamgbe Naijiria malitekwara ọchịchị onyekwuouche ya n'afọ 1999. Bido mgbe ha malitere ọrụ n'abalị itoolu nke ọnwa Juun afọ 2015, ụlọ omeiwu nke asatọ (nke ukwu na nke ata) emepụtala iwu dị narị iri isii na iri anọ na anọ (644), dika ndị otu Policy and Legal Advocacy Centre (PLAC) si depụta.

Onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyelarị aka na iwu iri anọ na asatọ n'ime ha mee ka ha soro n'iwu obodo Naijiria, mana ọtụtụ n'ime ha ka ọ jụrụ ibinye aka.

2. Osote onyeisi si na pati nke nta:

Nke ọzọkwa bụ n'ụlọ omeiwu nke asatọ ka ọ nọ mee, bụ nke izizi osote onyeisi ya si n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-abughi ndị nọ n'ọchịchị wee pụta. Ọtụrụ ndị mmadụ n'anya mgbe Ike Ekweremadu tuuru ugo dịka osote onyeisi ụlọ omeiwu ukwu na-agbanyeghi na otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke o so na ya abụghi nke kachasị nwee mmadụ n'ụlọ omeiwu ma bụrụ ndị nọ n'ọchịchị.

N'aka nke ọzọ, onyeisi ụlọ omeiwu ukwu bụ Bukola Saraki, bụ onye isi omeiwu nke izizi na Naijiria nke e boro ebubo nrụrụaka ma kpụpụ ya ụlọikpe ka ọ ga zara ọnụ ya. Ụlọ ikpe mechara sị ya laa na ikpe amaghị ya.

3. Nghọtahe ha na onyeisiala:

A ga-echetakwa ụlọ omeiwu nke asatọ dịka nke ha na onyeisiala kachaa nwee nghọtahịe. Nke a nwere ike bụrụ maka na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) akwadoghị ọchịchị Bukola Saraki na Yakubu Dogara bụ ndị isi ụlọ omeiwu nke ukwu na nke nta.

Nghọtahịe a dị n'etiti ndị omeiwu na onyeisiala biara mee ka usoro iweputa atụmatụ mmefu ego, nke Bekee kpọrọ 'budget', na-egbu nnukwu oge.

4. Nd omekome wakporo ogige nd omeiwu:

Ihe ọzọkwa kwesiri ncheta bụ mgbe ndị omekome wakporo ụlọ omeiwu ukwu n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Eprelu 2018 maburu akara ikikere ha nke a kpọrọ 'mace' n'asụsụ Bekee. Ndị uweojii mechara kwuo na ha chọtara ya bụ akara ikikere n'okpuru akwa okporoụzọ dị n'Abuja.

5. Mwepụta atụmatụ a kpọrọ 'Not too young to run':

Ọbụkwa ndị ụlọ omeiwu nke asatọ mepụtara iwu nke belatara afọ ole mmadụ ga-agba tupu ya azọ ọchịchị na Naijiria. Dịka iwu ọhụrụ ahụ si dị, onye ọbụla chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala Naijiria, maọbụ gọvanọ steeti, maọbụ onye otu ụlọ omeiwu ukwu, ga-agbarịrị afọ iri atọ na ise. Iwu nke ochie kwuburu na mmadụ ga-agba iri afọ anọ tupu ọ zọọ ọkwa onyeisiala.

Ọzọkwa, onye chọrọ ịga ụlọ omeiwu nta maọbụ ụlọ omeiwu steeti, ga-agba afọ iri abụọ na ise, ọbụghịzị afọ iri atọ dịka iwu nke ochie si kwuo.

Ihe ndi mmadu na-ekwu soshial midia

Ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na ụlọ omeiwu nke asatọ gbalịrị nnọọ nke ọma, mana ụfọdụ ndị ọzọ ekwetaghị nkea.

@nzewigodwin kwuru na ụlọ omeiwu nke asatọ bụ ọkaibe

@ElaborJoel1 kwukwara na Saraki nakwa Dogara mere nke ọma na afọ anọ ha nọrọ n'ochịchị

@Henryblaze50 kwuru na ọbụrụ ihe ule, ụlọ omeiwu nke asatọ gafere ule nke oma.

Mana @olusegunmaiye sị na ya achọpụtaghị ihe ọbụla ndị isi ụlọ omeiwu etiti mepụtara.

@ajoseganiyu kwukwara na-onweghi ihe ọbụla bara uru ụlọ omeiwu ukwu meputara karia mpụ na nrụrụaka.

Ndị omeiwu mere ihe ha kpọrọ "Valedictory Session" taa. Lee ka o si gaa: