Ahmad Ahmad's Arrest : A nwụchiela onyeisi CAF maka ebubo nrụrụaka

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Confederation of African Football(CAF) bụ otu na-achịka egwu bọọlụ n' Afrịka ekwuola n'ezie na anwụchiri onnyeisi ha bụ Ahmad Ahmad na Paris maka 'ihe gbasara nnyocha ọkwa ya dịka onyeisi Caf." maka ghị ihe ọbụla maka kepukepu na ndị uweojii nwụchiri onyeisi ha bụ Ahmad Ahmad maka ebubo nrụrụaka.

Ha kwuru na "Fifa amaghị kpọmkwem ihe gbasara nnyocha ahụ, ya mere na ha enweghị ike ikwu ihe ọ bụla banyere okwu ahụ."

"Fifa na-ajụ ndị gọọmenti France maka ozi banyere nnyocha ahụ nke na-aga na kọmịti na-ahụ maka eziagwa."

Akwụkwọ akụkọ Jeune Afrique kwuru na a nwụchiri Ahmad n'ụtụ Tọzde na Berri Hotel dị na Paris maka ebubo nrụrụaka gbasara ụlọọrụ a kpọrọ, Tactical Steel.

A kagbuola asọmpi Caf ikpeazụ a gbara

Ha kwuru na ha ga-enwe mkpebi ebe na ụbọchị a ga-emegharị asọmpi ahụ.