You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigeria vs USA: Ụmụ Amerịka ejirila Flying Eagles gbaa okoso na Poland
Otu egwuregwu Naịjirịa na-achọchite anya ha n'asọmpị akpọrọ Fifa Under 20 World Cup a na-agba na mba Poland na ogbo ha nke mba Amerịka zutere taata n'agba nke abụọ ha.
Agbanyeghị na ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe nchekube na Naịjirịa ga-eme ọfụma n'asọmpị a maka ha ji Qatar kwọcha aka mgbe ha zutere, dịka Amerịka dara na nke ha na Ukraine, ụmụ Super Eagles ahụghị ụkwụ ha.
Ọ bụ ka a ka ji nkeji iri na asaa banye ya bụ asọmpị ka Sabastian Soto kpịakara goolu Naịjiara.
Ka a ka na-ekwu nke o mere, n'agba nke abụọ, Soto ekweghịdị ka ụmụ Naịjirịa metụ bọọlụ ụkwu tupu o nye goolu abụọ ya nkeji 46.
Na nkeji iri na ise, agbaturu nwafọ Naịjirịa bụ Kingsley Michael n'ọnụ goolu Amerịka nke mere onye na-egbu bọọlụ jiri ga-ịgba ihe onyonyo Bekee kpọrọ VAR ajụjụ o were si na ọbụghị penarịtị.
Naịjirịa na Ukraine ga-ezute dịka USA na Qatar ga-ezute n'agba nke atọ.