You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Naira Marley : Ihe i kwesiri ịma maka nwa amadi a
Ụlọikpe nọrọ n'Abuja ụbọchị Wenezde highariala ikpe onye otiegwu, Azeez Fashola a maara dịka 'Naira Marley', bugaa ya ụbọchị Tọọzde.
A na-ekpe Naira Marley ikpe maka ebubo igwu wayo nakwa izu ohi.
Kemgbe ndị EFCC nwuchikọrọ otiegwu Naira Marley , otu a ka aha ya na egwu o tigara na-ewu ebe nile ọkachasị na soshal midia.
I ji mara nke bụ eziokwu na nke bụ asị, lee anya ka ị mara ihe nile i kwesiri ịma maka Naira Marley.
1. ọ bụ site na aha onye na-eti egwu rege ama ama bụ Bob Marley ka o si dọbiri aha ya ; Naira Marley.
2. Ya bụ nwokoroọbịa na akọwakwa na ọ bụ ya bidoro egwu ọhụrụ a na-akpo " Afrobashment".
3. A mụrụ nwa amadị a na Naịjirịa mana ọ lara mba Briten mgbe ọ dị afọ iri na otu.
4. Egwu mbụ ọ gụrụ nke gosipụtara ya bụ "Marry Juanna" na mba UK.
5. Egwu ya wuru ewu na Naịjirịa bụ "Issa goal" nke ya na Olamide na lil'kesh kụrụ.
6. Ọ baara simi mba na ya akọtọzila ndi na eme "yahoo yahoo", kwuo na ha abụghị ndị ohi.
7. Ka Naira Marley tichara egwu ọ kpọrọ "Am i a yahoo boy?" nke putara "a bu m onye yahoo?" ka ndị EFCC nwuchiri ma kpochie ya.
8. Ndị nchịkọta nwa okoroọbịa bịara kwuo na ya bụ Naira Marley abughị onye "yahoo yahoo" kwuo kwa na ha na-eme ihe nile i ji kpọpụta ya n'oge na adịghị anya.