You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Cardi B: Lee ihe ndị 'celebrity' bụ tupu ha achakee
Ụfọdụ ndị ama ama tara ahụhụ na nwata tupu ha abụrụ ihe ha bụ ugbua.
Ụfọdụ sị n'ezinaụlọ kpara ogbenye ebe ndị ọzọ si n'ezinaụlọ bụ akajiakụ.
Ọtụtụ mmadụ amaghị ihe ụfọdụ gabigara tupu ha abụrụ ihe ha bụ ugbua.
Cardi B nke mba Amerika kwuru na ya gbara akwụna nke ndị na-agba egwu a na-akpọ "stripper", ma zuo ụfọdụ ụmụnwoke ohi, tupu ọ bụrụ ihe ọ bụ ugbua; bụ otiegwu a na-anụ aha ya na mbaụwa.
Ụzụ Cardi B na-atụ maka na akụkọ kọrọ na ọ bụ onye ọgba ọtọ na-atụrụ ụmụnwoke ego tupu ọ bụrụ onye ama ama.
Mana ọ bụghị naanị Cardi B bụ onye a ma ama nwere akụkọ ihe mere ochie.
Ya kpatara anyị ji tinye anya ịmata ihe ndị ama ama ndị ọzọ mere iji rute ebe ha rutere ugbua.
Lee akụkọ a na-atule ụfọdụ n'ime ha:
Jay Jay Okocha
Jay Jay Okocha bughariri ojoko (Plantain} mgbe ọ dị na nwata.
Bobmanuel Udokwu
Bobmanuel Udokwu bụ onye ama ama maka ihe onyoonyo so nna ya azụ ahịa na Main Market Enugwu tupu ọ banye Nollywood.
Otiegwu Buchi
Enyioma Atuonwu (Buchi) bụ onye otu nzuzo tupu o chegharịa ma jirizie egwu na-agbasa oziọma.
Ọ bụkwa onye "obioma" dụọdụọ na-akwa akwa.
Ọ bụkwa onye nkụzi na Mahadum Legọs.
Frank Edward
Frank Edwards bụ onye mgbere mgbe ọ dị na nwata.
Paul Okoye
Paul Okoye na nwanne ya Peter rere bụredị
Mr Raw
Mr. Raw mụrụ mekanik.
O rekwara ncha gbakwa ọsọahịa na Coal Camp Enugwu.
Victor Osuagwu
Victor Osuagwu buru aja na mmiri mgbe ọ nọ ụlọakwụkwọ sekọndịrị.
Akụkọ ga-amasi gị: