Nigerian pastors: Ụkọchukwu ndị 'na-eti eti' n'ọwụwa-anyanwụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụfọdụ ndị ụkọchukwu na Naịjirịa bụ ndị a na-ahụta dịka ndị "ma nke ha riri" ma a bịa n'ịta akụnaụba.

Ndị ụkọchukwu a, ganye ndị nke ụlọụka ha dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ, bụ ndị hibere ụlọụka nke ha, ma nwee ọtụtụ ndị na-abịa efe ofufe ebe ahụ.

Ọtụtụ ndị na-aga n'ụlọụka ha bụ ndị ọ ga-abụ a sị ha "wụlie elu" ha asị "kedụ ogo ị chọrọ ka anyị wụruo?"

Nke a kpatara ọtụtụ ndị mmadụ si eche na ndị a na-aga ụka ha anaghị ahụ ihe ọjọọ ọbụla n'ime ibunye ndị ụkọchukwu a ego ọbụla ha nwere ka ha na-ebi ndị ọma, ebe ha na-ata ahụhụ.

Lee ụfọdụ n'ime ndị ụkọchukwu ahụ na etu ha si wuo maka ịta akụ.

1) Intercessor Jehovah:

Onye a bụ onye amụma na-ewu ewu n'Aba, Abịa steeti maka ihe ọ na-eme n'ụlọụka ya bụ "Holy Ghost searchlight and deliverance ministry".

E ji onye na-ebibi mmụọ ọjọọ a kpọrọ "demon destroyer" mara ya.

Ọ bụ otu nwoke ma ka e si ata akụ n'ụzọ gụnyere ịzụ ụgbọala bụ "elelebe ejeghi ọrụ", dịka ndị ụlọụka ya tinyere na soshal midia, nke ọ zụrụ ọhụrụ n'ọnwa Maachị a mere ya Hummer Limousine stretch nke atọ ọ na-azụta.

2) Onye amụma Chukwuemeka Ohanaemere:

Onye amụma a ama dịka Odumejeje, bụ onye hibere ụlọụka ọ kpọrọ "Mountain Of Holy Ghost Intervention And Deliverance Ministry", dị n'Ọnicha, Anambara steeti.

Ọ bụ otu onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ na mpaghara ọwụwa-anyanwụ maka etu o si agbasa aka n'ihe banyere akụnaụba.

Ụfọdụ oge ka a hụrụ ya ebe ọ na-abọnye ego n'elu ọdọmmiri, oge ọzọ ka a hụrụ ya ebe ọ na-abọ otu onye Nollywood ego.

3) Onye amụma Ebelenna Chukwu

Ebelenna bụ onye ọzọ na-ewu ewu n'ala Ọnịcha, Anambara steeti.

Ọ bụ onye hibere ụlọụka a ma dịka "Jehovah The Mightier Than All Prophetic Church".

A hụla ya n'ihe nkiri ebe ọ nọ na-efe nnukwu ego ka otu onye ụlọụka ya na-agba nkwụ.

N'ihe onyonyo ahụ, otu onye bu akpati ego na-esogharị ya ka ọ na-abọ ya bụ ego.