The Resurrection Challenge: Amụma isii wuru ewu na soshal midia

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọ bụ mgbe ụfọdụ ụlọozu na mba Saụt Afrịka kpebiri ịkpụpụ otu ụkọchukwu bụ Alph Lukau ụlọikpe maka aghụghọ ka okwu bidoro.

Ha kwuru na Lukau ghọgburu ha, iji mee ka ha sonye n'aghụghọ ịkpọlite mmadụ n'ọnwụ.

Nke a mere ka anyị họpụta amụma ndị ọzọ bụ ihe ịtụ anya mere na mpaghara Afrịka.

1. Ụkọchukwu na-amị ara ụmụnwaayị iji zọpụta ha.

Otu ụkọchukwu kpọrọ onwe ya "Chijioke" gara kpọghe ụlọụka na mba Kenya.

O malitere iwu mgbe ọ gwara ụmụnwaanyị ha bịa n'ụlọụka ya ka ọ mịa ha ara iji mịpụta mmụọ ọjọọ dị n'ime ha.

Gee ihe ọ gwara onye ntaakụkọ n'uju mgbe ha gbara ya ajụjụ ọnụ.

2. Onye gwara ndị nso ya loo agwọ

Penuel Mnuguni gwara ndị nso ya ha loo agwọ iji kwado ebe akwụkwọ nsọ kwuru na "ị ga-ejiri ọkpa gị zogbuo akpị na agwo mana o nweghi ihe ga-emetụta gị"

3. Onye gbara ndị nso ya ọgwụ anwụ

Letheboo Rabalago malitere iwu mgbe akụkọ pụtara na ọ na-agba ndị ụlọụka ya ọgwụ anwụ iji gwọ ọrịa nje HIV nakwa ọrịa kansa.

Ụkọchukwu ahụ na mba Saụt Afrịka mechara gaa ụlọ mkpọrọ maka ịda iwu imerụ mmadụ ahụ.

4. "Taanụ ahịhịa iji bịa Chineke nso"

N'otu Saut Afrịka ahụ kwa, Lesego Daniel gwara ndị nso ya ha pụọ n'ọhịa gaa taa ahịhịa dịka anụmanụ.

O kwuru na nke a ga-eme ka ha bịa Chineke nso.

5. Onye gara eluigwe ya na Chukwu 'esee foto'

Otu ụkọchukwu a kpọrọ Mbhoro gwara ndị nso ya na ọ gara eluigwe ị ga mmemme, ya na Chineke were see foto.

O bidokwara ịresi ndị otu ya foto ya na Chineke sere n'eluigwe.

6. Ụkọchukwu Ghana kwuru na ya ahụtụla Adam na Eve

Ụkọchukwu, ụka 'International Gods Way Church' , Ghana ama ama bụ Daniel Obinim na-ewu ewu maka ihe 'nrịbaama' dị iche iche ọ na eme.

Ihe ndị a gụnyere ime ka nwoke ihe nwoke jiri buru nwoke mere mpe buwa ya ibu site na ịhịọ ya aka.

Ọzọ, Obinim kwuru na ya ejiri la anya ya hụ Adam na Eve.

Obirin anwalela ifega eluigwe mana ndị ụka ya gbochiri ya.

A makwa Daniel dịka ụkọchụkwu na-'achụ ajọ mụọ' n'ụzọ na-atụ na anya .

A makwa Obinim maka inye ndị mmadụ akara ha ji nwe nrite na ịgba chacha.