You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anambra state: Aka ndị uweojii akparala di na nwunye rere nwa ha
Ndị uweojii n'Anambra steeti anwuchiela di na nwunye rere nwa ha mụrụ ka ọ gachara abalị atọ.
Nke a mere ka ama gbaara ha n'Area Command Ihiala ebe ha waporo ezinaụlọ Chinonso na Oluebube Anyanwụ bụ ndị Ibiasiegbe n'Imo steeti.
Ndị a resiri Sandra Odimege nwa ha narị naịra atọ (N300,000).
Sandra bụ onye Umuezike, Amorka nke dị n'Ihiala LGA n'Anambra Steeti.
Mmadụ atọ a nọ n'aka ndị uweojii ugbua n'esi rọdụ.
Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra sị na "ahụ dị nwa ọhụrụ ahụ mma".
Mohammed sị na ndị ọrụ ha ewepụla ya bụ okwu ụlọikpe ka ha tinyen anya na ya bụ okwu.