Arsenal vs Brighton: "Top 4" akwaala Arsenal etu ọ kwara Man Utd?

Arsenal nọzị n'ọnọdụ "agba ekpere chi" ka ha na-eche ịma ma asọmpi Champions League nke afọ na-abịa ọ kwaala ha n'ezie.

Ka ọ dị ugbua, enweghi ebe ha ji azụ aga, mana ha nwere obere olileanya ma ọ bụrụ na ha nwee ike merie asọmpi Europa League.

Ụzọ ọzọ bụ ma ọ bụrụ na ha merie Burnley na Premier League, ma banye chaplet ha na mmiri ka Everton gwọọ Tottenham ara a gwọrọ ibe ha.

Ndị Arsenal nweburu olileanya imeri egwuregwu a ka Pierre Emerick Aubameyang bu ụzọ jiri penariti gbanye goolu na nkeji itoolu e ji bido bọọlụ.

Glenn Murray jikwa penariti sata goolu nke ha na nkeji 61.

Otu abụọ a, ọkachasị Brighton gbara elu gbaa ala, mana goolu ekweghi aba.

Pascal Gross nke Brighton nwetara ohere iji nri chinyere gbarie neetị Leno, mana ọ gbafuru ya.

Ka ọ dị ugbua, ndị Arsenal na-ekpe ekpere imeri ma ruo Champions League, makana ọ dị ka ụgbọ ahụ nọ na "kwara pụ, kwara pụ".

Cheta na nke a ga-abụ asọmpị ikpeazụ Petr Cech na Aaron Ramsey ga agbara otu Arsenal dịka ha na-apụ na ngwụcha afọ a.