You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị ụlọomeiwu Anambra steeti echeela ndị uweojii aka mgba
Akụkọ dị mkpa
Ndị ụlọomeiwu anambra steeti agwaala ndị uweojii ka ha gbahie ụlọọrụ ha ha mechiri ka mgbe izuụka garaaga ka ha rụọ ọrụ ha.
Cheta na nsogbu dara n'ụlọọrụ ahụ oge ụfọdụ n'ime ndị omeiwu steeti ahụ chuturu onyeisi ha bụ Rita Maduagwu, mana Maduagwu ka na-ekwu na ya bụ onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ.
Atiku ekwela ndị Naịjirịa nkwa
Atiku ekwuola na ọchịchị ya ga-abụ maka mmadụ niile nọ na Naijiria, na agbanyeghị mpaghara ha si.
O kwuru nke a na Monde n'ime ozi ịchụ nta vootu maka 2019.
N'ofesi
N'ofesi, ndị uweojii anwụchiela Carlos Ghosn bụ onyeisi ụlọọrụ Nissan na-arụpụta ugbọala dị iche iche.
Ha na-ebo ya ebubo mpu na aghụghọ.
N'egwuregwu
Onye ọgbabọọlụ otu Wolves bụ Jonny Otto agaghị eso n'asọmpị ọbụla ruo izu isii makana akwara dọwara ya.
N'akụkọ yiri ibe ya, ndị uweojii na-ekwu na ha ka na-eleba anya n'ebubo nwakpo dị n'isi ọgba bọọlụ ama ama aha ya bụ Paul Gascoigne.
Mana Gascoigne na-ekwusi ike na aka ya dị ọcha.
Gee nkeji abalị a
Lee ihe nkiri anyị