You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụkọ ụgbọala Keke akpọwala ndị mmadụ n'ụzọ n'Abịa steeti ka iwu ọhụru malitere ọru
Akụkọ ruru BBC Igbo nti site Abịa steetị na-akọwa na ndị njem tọọrọ n'ụzọ ụnyaahụ bu ụbọchị nke iri na ano nke ọnwa Epreelu 2019.
Foto ezitere BBC Igbo na-egosi ndị mmadụ nọ a okporo ụzọ na-eche ụgbọala ga-eburu ha gawa ebe ha na-aga.
Kọmịshọna mgbasa ozi n'Abịa steeti bụ John Okeiyi gwara BBC Igbo na ihe kpatara ojiri di etu a bụ makana ụnyaahụ bụ ụbọchị mbido atumatu ọhụrụ gọọmentị Abịa wepụtara iji belata oke mpụ ntọọrị mmadu na-eme n'Abịa.
Ọ sị na: "Ọ bụ site elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere itoolu nke abalị ka keke na-agba mbụ, mana gọọmentị Abịa welatara ya elekere asaa.
Ụnyaahụ bụ mbido ya, ya mere oji gbagwojuo ndị mmadụ anya."BBC jụrụ ma etinyekwere ahụhụ ndị mmadụ na-ata n'uche mgbe a na-ehibe iwu a.
Maazi Okeiyi sị na ihe a bu obele ahụhụ ndị mmadu ga-ata nwa mgbenta, makana "na o ga dị etu a ruo mgbe ahazichara nchewa, karịa iji ya bụ usoro na-atọọrị ma na-ezu ndị mmadụ ori.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọgaghị adịghịde.
"Ahazicha usoro nchekwa, anyị ga-achọ ka ọbụrụ mgbe niile ka keke na-agba."