Ọchụehi Abia: Anyị agaghị ewepụ iwu nchịgharị ehi - ndị omeiwu

Onyeisiụlọ omeiwu nke Abia Steeti bụ Chikwendu Kanu akatọọla ndị na-akpọ oku ka-ewepụ iwe machiri ịchagharị ehi na Steeti ahụ.

O kwuru na ndị na-akpọ oku a amaghị ihe nakwa ikikere ndị ụlọ omeiwu steeti nwere ime mkpebi ha.

Cheta na Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa bụ Mansu Dan-Ali gwara onyeisiala Buhari ka okpochapụ iwu megidere ịchagharị ehi n'ụfọdụ steeti.

Ma kwuo na ọ bụ naanị ụzọ a ga-eji weta udo n'etiti ndị na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo.

Mana ụlọ omeiwu nke Abịa Steeti mere iwu ga-akwụsị ịchagharị ihe na Steeti ahụ ma kwuo na onye e jidere ga-akwụ puku narị naịra abụọ ma ọ bụ gaa mkpọrọ afọ isii.

N'okwu ya Kanu katọrọ ndị na-akpọ oku ahụ, kwuo na ụlọ omeiwu ọbụla na-eme iwu ga-echekwa ndị ọ na-achị.

Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, Chikwendu kwuru na iwu a dị n'ike ndị ụlọ omeiwu ime nke mere ha jiri hiwe ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: