You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ikpe: Innoson ekwetala na ha duhiere ọha
Ụlọọrụ Innoson ekwupụtala na ha duhiere ọha n'ozi ha wepụtara ebe ha kwuru n'ụlọikpe kachasị kpebiri ka GTbank kwụọ ha ijeri naira iri na anọ (N14bn).
N'akwụkwọ ozi Innoson wepụtara n'abalị asaa nke ọnwa Juun n'afọ 2018, ha kwupụtakwara na ụlọikpe nyere GTbank iwu ka ha kwụọ ha ego ahụ tupu izuụka abụọ aga.
Mana n'abalị iri na otu nke ọnwa Juun afọ a, Innoson kwugharịrị n'igwe okwu Twitter ha sị na ha kọwahiere mkpebi ụlọikpe ma duhiere ọha n'okwu ha na GTbank.
Cheta na, na nzaghachi nke GTbank nyeburu, ha kwuru n'ozi ha wepụtara nke odee akwụkwọ ụlọakụ ahụ bụ Erhi Obebeduo tinyere aka ya na ihe Innoson kwuru abụghị ihe mere eme.
Ọ sịrị: "Anya anyị eruola akụkọ na-efegharị na soshal midia nke kwuru ụlọikpe kacha na Naijiria nyere anyị iwu ka anyị kwụọ onye ọbụla iji anyị ụgwọ.
"Nke a bụ iji gwa ndị na-etinye ego n'ụlọakụ anyị na ọha ka ha ghara iji okwu ahụ na-efegharị nke kwuru na ụlọikpe kachasị nyere anyị iwu ịkwụ onye ọbụla anyị na ya na-emekọ ihe ụgwọ ọbụla.
"Ụlọikpe kachasị ekwughị ihe ọbụla banyere anyị ịkwụ onye ọbụla ego ọbụla.
Ọzọkwa bụ na adịghị eziokwu dị n'ime akụkọ ndị mmadụ na-ekwu gbasara okwu a mana ọha legharịa ụdị okwu a n'uju."