You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ogbugbu Igwe: Obodo Ogbozinne dịzị ka ebe agbara ọsọ agha
Obodo Ogbozinne Akpugo dị n'okpuru ọchịchị Nkanu West n'Enugwu steeti nọ na nnukwu nsogbu ugbua n'ihi na ha tigburu igwe na-achị obodo ahụ.
Ogbozinne ahụ dịzị ka ebe agbara ọsọ n'ihi na ndị ụmụnwoke na ndị ntoroọbịa agbaala ọsọ n'obodo ahụ maka egwu ndị uweojii.
Mgbe BBC Igbo rutere n'Ogonogieji Ndiunọ nke Ogbozinne nọ n'ime ya, a hụrụ na ọtụtụ ọnụ ụlọ gbachiri agbachị ebe ndi bị na ha gbagara n'obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu.
Naanị otu nwaanyị kwere ka-agbaa ya ajụjụ ọnụ n'ihe onyonyo kwuru na ọ bụ aka nchịgbu Igwe Steven Nwatu ji na-achị ndị Ogbọzinne mere ndị obodo jịrị kaa obi gbuo ya.
Ọ kwara arịrị na ka mgbe afọ iri onye eze ahụ were ọchịchị, ahụ afọzighị ndị obodo ahụ ha n'ihi na onye ọbụla na agba nkwụ, ili ozu ma ọ bụ mmemme ọbụla ga akwụnyere akatankpo ego n'aka Igwe na ndị otu ya.
Nwanyị ahụ boro Igwe Steven Nwatu nwụrụ anwụ ebubo na ọ na-eji ndi uweojii SARS na-akpụrụ ma kpọchikwaa onye ọbụla ọchọrọ n'ụlọ mkpọrọ.
Dika ndị ọzọ zara ajụjụ onụ siri kwo, na ndị obodo kwadoro igakwa ọzọ kpesara Governor na-achị Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi esomokwu di n'etiti ha na Igwe Nwatu.
Ngwa ngwa ha zukọrọ ka Igwe na ndị uweojii SARS bịakwara ọzọ ịgbasa nzụkọ ndị obodo.
Ha kwuru na Igwe were ụgbọala ya kụjie otu nwa okorobịa ụkwụ, tinyekwara na ndị SARS na-agba egbe aghara aghara, ndị obodo gbakọrọ ọnu gbaa ya bụ Igwe ọtọ, tie ya ihe.
E buzị ya gaa ụlọọgwụ ebe ọ nwụrụ dịka ọ na-anata ọgwụgwọ.
Ọtụtụ ndị obodo kwuru na ọbụ maka na Igwe ekweghị ka-ehiwe ọgbakọ obodo bụ 'Town union' n'obodo ahụ butere ọnwụ ya.
Ọtụtụ ụlọ bụ nke amụnyere ọkụ ebe emebikwara ụfọdụ n'obodo ahu.
Banyere okwu ndị SARS ndị mmadụ na-ekwu na-eso igwe a, onye na ekwuchitere ndị uweojii ọnụ ha n'Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu ekwuola na-aka ndị uweojii SARS adighị na esomokwu ahụ kpatara ọnwụ Igwe n'Ogbozinne Akpugo.Okwu a bụ iji saa ebubo ụfọdụ ndị obodo ahụ boro, na Igwe ahụ nwụrụ anwụ du ndị SARS na-akpụkọsị ndị mmadụ na agba egbe aghara aghara nke butere nsogbu.
Otu nwanyị gwara BBC Igbo na-ya ji anya ya hụ ka ya bụ Igwe Steven Nwatụ na ndị SARS gara ebe umu nwoke gbakọrọ ịga njem ga hụ Gọvanọ Ifeanyị Ugwuanyị. Oteghịzi aka, alụba ọgụ, were tigbue Igwe.Ebere Amaraizu kwuru na akụkọ ahụ abụghị eziokwu. Ọ sịrị na ndị uwe ojii anoghị ebe ahụ mgbe ya bụ ihe mere, wee sị na ọ bụrụ na ndị uwe ojii nọ ebe ahụ, ha agaghị ekwe ha tigbue igwe ha.Ọ dọrọ ndị mmadụ aka na-ntị ka ha ghara ịdị na ebo ebubo na enweghị isi.Amarizu kwuru na ndị na ekwu ihe dị etua na agbachịrị uwe ojii ụzọ ịchọpụta ndị kpara arụ ahụ.O kwekwara nkwa na ha mee elu mee ala ndị uwe ojii dị njikere ịhụ isi ya bụ ihe ma na echekwaba ndụ na akụ na ụba ndị mmadụ oge niile.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: