AFCON 2019 Draw: Burundi na Madagascar bụ elelia nwaite - Gernot Rohr

Onye nkụzị ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na ndị otu ya ga-akpachapụ anya n'izute ndị egwu bọọlụ Burundi nakwa Madagascar.

Nke a bụ mbụ ndị mba abụọ a na-etozu iso gbaa asọmpi a kemgbe ọ malitere na-afọ 1957.

Rohr sị na "ọ dị mma ihu ụdị uchu na obiike mba abụọ ga-ewebeta n'egwuruegwu a".

Ọ kwukwara na ya ma Madagascar nke ọ ma "maka nwunye ya bụ onye mba ahụ".

Rohr tokwara Burundi ka ha sị merie Gabon mgbe a na-azọ onye ga-etozu ịpụta n'ọgbọ a.

Ọ sị na ya n'atụ anya izute ndị otu egwu bọọlụ siri ike dị ka Senegal and Ghana n'asọmpi enyi na enyi tupu amalite ịsọmpị African Championship n'onwe ya.

Rohr kwara BBC nke a ụnyahụ mgbe a tụchara nchọ AFCON na Egypt.

Naịjirịa dabanyere n'ime otu nke a kpọrọ "group B", bụ ebe ha na mba Guinea, Madagascar na Burundi ga-esukọta mpi.

Kedụ ihe o ji dị ka ha alaferela? Nke a bụ mbụ mba Burundi na-abịa asọmpi Iko mba Afrịka kemgbe e ji hibe ya n'afọ 1957.

Mba Egypt bụ ndị ga-ele mba ndị ọzọ ọbịa n'asọmpi a, ga-ezute DR Congo, Uganda na Zimbabwe n'otu A.

Ndị ga-ezute ibe:

Ndị ọzọ ga-ezute onwe ha mezuru ya mba 24 ga-eso zọọ asọmpi a.

Otu C

Senegal

Algeria

Kenya

Tanzania

Otu D

Morocco

Cote D'Ivoire

South Africa

Namibia

Otu E

Tunisia

Mali

Mauritania

Angola

Otu F

Cameroon

Ghana

Benin

Guinea-Bissau

Ndị burula iko a na ugboro ole ha burula ya:

Kemgbe ahụ otu a ka esi buo iko a:

Egypt: ugboro asaa: (1957, 1959, 1986, 1998, 2006, 2008, 2010)

Cameroon: ugboro ise (1984, 1988, 2000, 2002, 2017)

Ghana: ugboro anọ: (1963, 1965, 1978, 1982)

Nigeria: ugboro atọ (1980, 1994, 2013)

Ivory Coast: ugboro abụọ (1992, 2015)

DR Congo¶ ugboro abụọ (1968, 1974)

Zambia: otu ugboro (2012)

Tunisia: otu ugboro (2004)

Sudan: otu ugboro (1970)

Algeria: otu ugboro (1990)

Ethiopia: otu ugboro (1962)

Morocco: otu ugboro (1976)

South Africa: otu ugboro (1996)

Congo: otu ugboro (1972)

Akụkọ ga-amasị gị