You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu leaked video: Ụwa niile ahụla na gị bụ nwunye m mara mma na-ese okwu - Kanu
Nnamdi Kanu etinyela ọnụ n'ihe gbasara ihe onyonyo gosiri ya na nwunye ya na-efegharị.
Kanu kwuru sị na "Ụwa niile ahụla na gị bụ nwunye m mara ezigbo mma dịka m na-ekwukarị n'elu igwe redio".
Lee ihe o kwuru n'elu Twitter ebe a:
Tupu Kanu ekwuputa okwu a, BBC Igbo kpọkuru Paul Achalla bụ ọkaiwu ndị IPOB, ebe o kwuru sị "Kanu achọghị ịtụpụ ọnụ gbasara ihe na-eme".
Achalla kwukwara sị na "Onweghi mgbe Nnamdi Kanu ji kwuo na nwaanyị anaghị amasị ya."
BBC Igbo tụpụrụ okwu ya n'elu Facebook, ka ndị mmadụ tinye ọnụ.
Ụfọdụ kwuru sị na ebe ọ bụ na ọ bụ nwunye ya so ya nọrọ n'ime ya bụ ihe onyonyo, na enweghi ihe ọjọọ o mere.
Ndị ọzọ na-ajụ etu ihe onyonyo a si pụta ihe, ebe ụfọdụ na-ekwukwa na ọ bụ ndị chọrọ imegide Kanu tụpụtara ihe onyonyo ahụ n'ezi.
Lee ihe ha kwuchara ebe a:
Akụkọ ga-amasị gị: