Nneka: 'Nwoke ọbụla hụrụ m n'anya ji m ụgwọ'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Soshal midia enwurula ọkụ maka okwu otu nwata nwaanyị kwuru gbasara ụmụnwoke.

"Nneka" ka o si nye aha ya n'elu igwe okwu Twitter, sị na "nwoke ọbụla hụrụ m n'anya ji m ụgwọ"

O kwukwara na ọ chọrọ ịbụ nwaanyị ga-anọ n'ụlọ na-elekọta di ya na ezinaụlọ ya.

Mana okwu ya ebidola mkparịtaụka n'etiti ụmụnwoke na ụmụnwaanyị n'ihe metụtara oriakụ na odoziakụ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu:

Collins sị na ọ bụ ụmụagbọghọ ndị Igbo na-akpa ụdịrị agwa a.

Enekem sị na ọtụtụ ụmụnwaanyị Naịjirịa niile na-eche echiche ka Nneka.

Oma kwuru na ụmụnwoke na-achọ ụgwọ nke ha n'ụzọ pụrụiche.

Henry sị na ọ bụrụ na o mefuo ego n'isi nwaanyị, na nwaanyị ahụ eburula nke ya.

Ebe Amarachi na-ekwu na onweghi onye ji ibe ya ụgwọ, ma nwoke ma nwaanyị.

Ọtụtụ mmadụ ka jisi ke etinye ọnụ n'okwu a ugbua mana gịnị bụ uche nke gị?

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị