Nwaanyị a gbara di ya ọkụ makana ọ na emegbu ya

Otu mgbede, otu nwoke aha ya bụ Deepak Ahluwalia ji igwe eji ede akwa ọkụ hie nwunnye ya bụ Kiranjit n'ihu nke nyere ya apa.

Nwaanyị a nwetere ezogbote ụhụ maka ihe a di ya mere ya nke naghara ya ụra.

Omeela afọ iri atọ ihe a mere, ọ gwara BBC na ọ bụ ihe mere ya jiri kpawa nkata etu ya ga-eji memina di ya ka ọtakwanụ ụdịrị ahụhụ ya na-ata.

N'ime ofu abalị ahụ di ya tere ya igwe akwa ahụ, ọ wụru ya mmanụ ọkụ n'aba ka ọ na ararụ ụra wee mụnye ya ọkụ.

Ka o mechara nke a, o kuru nwa ya gbapụ ọsọ.

"Eche m na ọ bụ sọ ụkwụ ya ga-agba ọkụ ka ọgharị ịchụ m. A ga m enye ya apa nke ga-eme mgbe ọ bụla ọ hụrụ m, o chete m."

Ọ si na ya atala ezigbo ahụhụ na mmegbu n'aka di ya ruo afọ iri.

Ọ sị na o bidoro n'ụbọchị ọ lụrụ ya.

Kiranjit siri ọnwụ na ya achọghị igbu di ya.

Mana ka ubọchị iri gachara, ọnya dị Deepak n'ahụ gburu ya.

A tụrụ Kiranjit nga n'ọnwa Decemba nke afọ ahụ. Mkpebi ụlọ ikpe bụ na ọ ga-anọ na nkpọrọ nwụọ maka ọnwụ di ya.

Mana ka otu ngalaba na-ahụ maka ikike dịrị onye bidoro mebe mkpọtụ maka okwu ya, ekpegharịrị ya, nke mere eji nye ha afọ atọ na ọnwa anọ n'ụlọ mkpọrọ.

Oge bụ oge ọ nọ na mkpọrọ mgbe ahụ, nke mere eji hapụ ha ka ọlaba.