Aliko Dangote: Mgbe m hụrụ nde dọla 10 nke m n'anya ka m kwetere na m enwere ego n'ezie
Akụkọ anyi hụpụtara n'ụtụtụ a

Ebe foto si, AFP
Dangote sị na anya hụ, obi ekwe
Onye bụ ọkachasị nwee ego n'Afịrịka bụ Aliko Dangote sị na ọgbara ya ka "ịhụ ị kwe" maka ego ya.
Dangote gwara nzukọ Mo Ibrahim emere n'Abijan, isi obobo mba Ivory Coast, na o nwere mgbe ha gara ụlọ akụ ga wepụta nde dọla iri ka obi sie ya ike na ide ya bụ abụghị so n'akwụkwọ.
Ọ sị; "Mgbe ị dị ntoroọbịa, nde mbụ ị ga-akpata dị oke mkpa, mana ya gafee, ọnụ ọgụgu ndị ọzọ adịghị adị ka ihe ọbụla."
"Otu oge, agara m ụlọ akụ, wepụta nde dọla iri, tinye ya n'ime ụgbọala m, buru ya ga ụlọ m wee kiribe ya. Ekirichara m ya wee kpebie na enwere m ego. Ka chi foro, ebughachirim ya n'ụlọ akụ."

Ebe foto si, AFP
Ogbugbu mmadụ na Zamfara
Ndị mmadụ mere ngaghari iwe n'Abuja ụnyaahụ maka ogbugbu mmadú ka na-aga n'ihu na Zamfara steeti.
Ótutú n'ime ha sí na góvano na-chi steeti ahú biú Abúbakar Yari na onyeisiala Naíjiría bu Muhammadú Buhari anaghi eme ihe ha kwesiri maka okwua.
Buhari n'onwe ya tinyere ọnụ na ya bụ okwu wee si na ya bụ onyeisiala obi na-asugbu karịa n'ụwa dum maka ogbugbu mmadụ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọ sị ndị ihe mere ka, ma sikwa na ya na-agba mbọ ịhụ n'okwusiri.

Ebe foto si, AFP
N'ofesi
Onye ngalaba United Nations kwadoro ka ọ na-ahaziị ihe na mba Libya bụ Fayez al-Serraj ekwuola na ya na ndị agha ya ga-echebiri ọchịagha Khalifa Haftar n'isi obodo mba ahụ bụ Tripoli
Ọchị agha Haftar na ndị agha ya nọ na njem ha si ga-ebi mgbe ha nwụchịrị Tripoli.











