You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
CBN Governor: Achụbeghi Emefiele n'ọrụ
Akụkọ pụtara n'ụbọchịanọ nke ọnwa Maachị 2019, kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari chụrụ onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Godwin Emefiele n'ọrụ.
Ụfọdụ kwuru na Buhari gwara ya sị ya gaa ezumike ga-eru ọnwa atọ ebe ọ ga-esi pụọ n'ụlọakụ ahụ.
Mana mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ụlọakụ CBN iji nụ olu ha gbasara okwu a, ha kwuru na o nweghi eziokwu dị na ya.
"Achụbeghi ya n'ọrụ" ka Isaac Okoroafor bụ onye ọrụ CBN gwara anyị.
Ụlọntaakụkọ Punch kwukwara na ha nụrụ kepu kepu na Emefiele ka nọ n'ụlọakụ ya chịm.
Mana ụfọdụ mmadụ ekwuola na Buhari na-akpa nkata iji onye ugwu na-ekpe alakụba dochie Godwin Emefiele.
Otu n'ime ha dịka @amaniro_s kwuru nke a n'akara Twitter ya.
Akụkọ ga-amasị gị: