Sanwo-Olu ka anyị ma - Ohaneze Ndigbo Lagos

Aha onyonyo, Ihe anyị jiri gwa Ndigbo na Legos tụnyere Sanwo-Olu- Ọhaneze Ndigbo Legọs
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu Ohaneze Ndigbo nke mpaghara Legọs, ekwuola na ha kwụ Babajide Sanwo-Olu n'azụ maka ịzọta oche dịka aka na-achị steeti ahụ.

Ndị eze

Solomon Ogbonna bụ onyeisi ha, kwuru na ndị Igbo bi na Legọs na-akwado ya makana ọ bụ onyendu ga-enye ha ihe ha chọrọ ma bụrụ onye ha nwere ike ịtụkwasị obi.

Sanwo-Olu mechara kelee ha maka ịnabata ya n'etiti ha.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Mnwereonwe Biafra abụghị ikwe ọnụ ahịa - Ipob

Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Otu na-achọ mnwereonwe Biafra na Naịjirịa bụ Ipob ekwuola na ọ gbasaghị ha onye ga-abụ onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa Mee na ọgwụla mwereonwe Biafra bụ ihe ka ha mkpa.

Odeakwụkwọ mgbasaozi ha bụ Emma Powerful kwuputara nke a ma kọwaa na mwereonwe Biafra abụghị ihe a na-ekwe ọnụ ahịa.

N'ofesi

Michael Spavor na Michael Kovrig bụ ndị eji kamgbe December

Ebe foto si, AFP

Mba China ebola mmadụ abụọ ndị Canada ha nwụchiri ebubo inyocha ha n'ụzọ n'ezighi ezi nke a na-eche bụ ha imegwara na nwuchi Canada nwuchiri nwafọ ha bụ Meng Manzhou.

Nke a emeela ka mmekọrịta dị n'etiti mba ndị a bụrụ zie ihe na-akụ ilu.

N'egwuregwu

Gareth Bale nke Real Madrid

Ebe foto si, Getty Images

Onye nlekọta Gareth bale na-agbara Real Madrid bọọlụ akatọọla emo ndị nkwado Real Madrid kwara Bale ma kwuo na ọ bụ ihe ihere nye ha.

Nke a mere n'oge ewepuru Gareth Bale site n'asọmpi ha na Barcelona gbara na Satọde.

Nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Mmebi okpommanụ na Bayelsa

Ndị uweojii kwuru na enweghi onye nwụrụ mana ọtụtụ ndị mmadụ ahapụla ụlọ ha gbalaga ka okpommanụ agbịdị gbariri na mpaghara Nembe dị na Bayelsa steeti.

Oke ọkụ ọgbụgba

Ebe foto si, Getty Images

N'agbanyeghị na ihe a mere na Fraịde, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Bayelsa bụ Asinim Butswat, gwara ndị ntaakụkọ na ha amabeghi ma ọ bụ ndị omekome wakporo ya ka ọ bụ ihe mmebi butere ya.

N'ofesi,

Ndị agha mba Izrel gbagburu mmadụ abụọ a na-enyo na ha bụ ndị Palestịne ma merụọ otu ahụ ka ndị ahụ bu ụgbọala ha nyakpuo n'etiti ebe ha bụ ndị agha nọ.

Ha ekwubeghi maka ọnọdụ ndị otu ha ụgbọala ahụ suru.

N'egwuregwu,

Enweghi onye meriri ibe ya ka Liverpool na Everton zutere n'abalị.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Nke a mere ka Manchester City ka kwụrụ ọtọ dịka eze n'elu tebulu na Premier League.

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ndigbo bị n’Okota na Oshodi, Legos chi obi n’aka maka ogbaghara gbasara ntuliaka mere