Leicester City: Ha achụọla onye nchịkọta ha ọsọ ụkwụ eru ala

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Leicester City chụrụ Claude Puel bụ onye nchịkọta ha ka Crystal Palace ji ọkpụ goolu nyebaa ha afọ.

Goolu anọ Wilfred Zaha, Batshuayi, na Milivojevic nyere, so kpọdo Puel n'obe e ji were ya chụọ aja.

Na Evans satara otu goolu emeghi ka ndị nyere Puel ọrụ gbaghara ya maọbụ Jacky Bonnevay bụ osote ya.

Ka e merichara ha n'abalị, Puel gwara ndị ntaakụkọ sị "anyị agbaghị bọọlụ a ọfụma."

Puel chịkọtara Leicester City otu afọ na ọnwa anọ tupu a chụọ ya taa.

Ntuliaka Sịnịgal

Mba Senegal ga-eme ntuliaka nke ha taa, ebe ha ga-ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala ha.

Gbadokwa anya ma chere mgbe ngalaba Inec gụpụtara mpụtara ihe a tụtara na vootu tupu i kwuwe onye meriri na ntuliaka, makana mpụtara adịgboroja na-efegharị.

N'otu aka ahụ, bata na BBC Igbo.com ịmata ihe niile banyere etu ntuliaka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọomeiwu a si aga nakwa mpụtara ndị a hụrụla anya.

Akụkọ ruru anyị ntị kwuru na ọgbaghara dapụtara ebe ụfọdụ e mere ntuliaka dịka Legọs, Kogi nakwa Rivas steeti, ebe e gburu ụfọdụ, merụọ ụfọdụ ahụ makwa gbaa ụfọdụ igbe ntuliaka ọkụ.

N'ofesi,

Ihe ruru mmadụ narị anwụọla, ebe ihe ruru narị ọzọ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ dị n'obodo Assam dị n'India maka mmanya ọkụ na-emerụ ahụ ha ṅụrụ.

Nke a na-abịa ka ụdịrị ọdachi a gbukwara ihe ruru mmadụ narị n'obodo Uttar Pradesh na Uttarakhad.

N'egwuregwu,

Goolu atọ Leo Messi nyere ka Barcelona ji goolu anọ asatara abụọ merie Sevilla, mere ka ọ bụrụ ugboro iri ise ọ na-enye goolu atọ n'ime otu egwuregwu nke bekee kpọrọ 'hattrick' , kemgbe ọ gbawara bọọlụ.

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji:

Ihe nkiri: