Atiku: Ngalaba EFCC anwụchiela onye ọkaiwu ya
Akụkọ dị mkpa:

Ebe foto si, @Atiku
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ndị EFCC anwụchiela onye ọkaiwu Atiku Abubakar bụ Uyi Giwa Osagie na Legọs.
E chere na a nwụchiri ya maka akpa ego e si Abuja ebuga Legos nke ndị ngalaba EFCC kpụghere mana o dobeghi anya ma nnwụchi a o metụtara ọrụ ya n' achụmnta vootu Atiku.

Ebe foto si, @nysc_ng
Ngalaba Inec ekwela nkwa ilekọta ndị na-efe ala nna ga-eso ha arụ ọrụ ntuliaka anya ọfụma.
Cheta na ndị mmadụ kpụ Inec n'ọnụ maka etu ha si hapụ ụmụ mmadụ chi horo ụbọchị ehigharịrị ntuliaka.
BBC Igbo agbaala otu afọ,
Oru na Igbo BBC Igbo agbaala otu afọ na mgbasa ozi taa.
N'ụbọchị a n'afọ gara aga, ka BBC Igbo malitere mgbasaozi dịka otu n'ime ndị e kewapụtara na mgbakwunye BBC W2020 maka ndị asụsu na-abụghị bekee.
Obi dị anyị mma maka ncheta ọmụmụ ụlọọrụ a, ma na-asị chere aka ghọrọ anyị n'ike na ebube.
N'ofesi,
Steeti iri na isii gụnyere Kalifonia, agbaala onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, akwụkwọ, maka mkpebi ya itinye ọnọdụ gbatagbata maka inweta ego o ji arụ mgbidi aja maka oke ala ha na Mekziko.

Ebe foto si, Getty Images
Onye ọkaikpe ukwu nke Kalifonia bụ Xavier Becerra, kwuru sị na ha na-agba ya akwụkwọ a ime ka ọ ghara imefu ụtụisi ndị mmadụ tụtara.
N'egwuregwu,
Ọ ka na-akpọtụ n'isi ndị Chelsea, ka ndị Man Utd gosiri ha nkarị ma jiri ọkpụ goolu abụọ gbapụ ha n'asọmpi Iko FA.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ajụjụ bụzị 'isi Chelsea a ga-apụtakwa ma ha zute Manchester City n'agba ikpeazụ nke asọmpi Iko Carabao n'ụbọchị iri abụọ na anọ nke ọnwa a?
Gere akụkọ BBC Igbo na nkeji ebe a:
Lee ihe nkiri anyị nwere taa:











