You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Tomatoes: Nke awara awa enwere ike ibunye gị kansa?
Ọ ka na-agbagọjụ ndị mmadụ anya ihe mere ọtụtụ ụmụ Naịjirịa ji azụkarị tomato rere ure hapụ nke siri ike.
Ụfọdụ ndị dibia bekee kwuru na ọ bụ makana ya bụ tomato dị ọnụ ala.
Okwu a pụtara mgbe okachamara n'ihe gbasara nri na Mahadum ahụike Teknuzu kwuru na iri tomato rere ure nwereike ibunye ndị mmadụ Kansa.
Otu nwagbọghọ na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na ọ na-amasị ya igoro tomato awara awara makana o sie ya, o sipu nje ọbụla ure nwereike ibute.
Ụmụnwaanyị na-ere ya bụ tomato awara awara kwuru na ndị mmadụ na-ebuzo egocha ya tupu ndị mmadụ achọwa nke zuruoke.
Mana ọkammụta Ajekhibe kwuru na ọ maghị maka tomato awara awa rere ure ibunye mmadụ kansa mana nri ọbụla rere ure ga-ebunyeli ọrịa kansa.
O kwuru na ụzọ atọ mmadụ nwereike ibute ọrịa kansa bụ site n'iri nri rere ure, mmanya maọbụ udiri enyi onye na-eme.
Ihe ndi mmadụ na-ekwu n'elu soshal
@Nerlong kwuru na nke a pụtara na ụmụ Naịjirịa agaghị erinwu nri ule n'udo.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: