You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
El Rufai: Ekwughị m okwu ụgha gbasara ndị mbịara mbịara
Akụkọ dị mkpa
Aka na-achị Kaduna steeti apụtala ị zara ọnụ ya gbasara ebubo okwu ụgha eboro ya.
O si n'aka onye enyemaka ya n'ihe mgbasa ozi bụ Samuel Aruwan zipu ozi kọwara na ihe o kwuru abụghị okwu ụgha ga-ebute ọgbaaghara
Ebe ọnụ na-ekwuchitere otu PDP bụ Kola Ologbondiyan ekwuola na ha ga-agbahapụ nkwekọrịta ụdọ (Peace Accord) nke ha na otu ndịọzọ binyere aka n'afọ gara aga n'ihi omume El-Rufai.
El-Rufai kwuru mgbe NTA gbara ajụjụ ọnụ na "onye ọbụla chọrọ ị bute ọgbatuhie na Naịjirịa, anyị na-eche ha, ha ga-alaghachị n'akpa ozu"
Ọzọ,
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naịjiria bụ Inec n'aha ịchafụ ekwuola na ha akagbuola PVC ruru otu puku bụ nke ndị mbịara mbịara denyere aha ịnata.
Onyeisioche Inec bụ Mahmood Yakubu kwuru nke a mgbe ọ na-akọwa etu ha si akwado ntuliaka 2019.
Na mba ofesi,
Otu ụlọ elu n'obodo Istanbul nke Turkey adaala n'ike ụbọchị Tọọzde ma gbuo otu onye.
Akụkọ na-ekwu na a ka na-achọ mmadụ anọ ebe ụfọdụ ụgbọala nakwa ndị mmadụ ka tọrọ n'okpuru ụlọ ahụ.
N'egwuregwu,
Onye ọpịa Tennis bụ Petra Kitova pụtara n'ụlọikpe taa inye okwu akaebe gbasara okwu onye sụrụ ya mma n'afọ 2016.
Kitova kọwara etu o si jiri ego zọpụta ndụ ya n'aka onye ahụ e chere na ọ chọrọ ịgbu ya.
Akụkọ BBC Igbo na nkeji
Ntuliaka 'Referendum' ndị ASUU
Ntuliaka nke otu jikọtara ndị nkuzi Mahadum mere iji mara ka ha ọ ga-akwụsị abụbọ ọrụ nke nọrọla ọnwa atọ gosiri na ọtụtụ n'ime ha chọrọ ka abụbọ ọrụ ahụ gaa n'ihu.
Na Mahadum nke Ibadan, ihe karịrị mmadụ narị abụọ binyere aka ka abụbọ ọrụ ahụ gaa n'ihu ebe ihe karịrị naanị mmadụ iri ise binyere aka ka ọ kwụsị.
Akụkọ kwuru na ihe mere ụfọdụ ndị nkuzi mahadum jiri họrọ ka ọ gaa n'ihu bụ maka enweghị ntụkwasị obi ndị gọọmentị n'imezu nkwa ha kwere.
"Eji m aka na iwu a abụghị iji tinye ụjọ n'ime ụmụafọ Igbo ka ha ghara ịpụta binyeka na ntuliaka na-abịa abịa? "
Nke a bụ okwu onyeisi Ohanaeze Ndigbo bụ Nnia Nwodo n'ihi iwu onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Tukur Buratai nyere ka akpachie ndị na-achọ nnwereonwe Biafra n'oge ntuliaka a.
N'ofesi
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ya na Onyeisiala mba Nọt Korịa bụ Kim Jong-un ga-enwe mkparịtaụka ọzọ banyere ngwaagha nuklịa.
Trump kwuru na nke a ga-eme na mba Vietnam n'ụbọchị iri abụọ na asa rue iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febụwarị.