You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
BBNaija Stampede: Ndị mmadụ e meruela ahụ n'ihe mmemme nhọpụta Big Brother Naija
Akụkọ na-erute anyị ntị na-ekwu na ndị mmadụ a mabeghị ole ha dị merụrụ ahụ, ebe ụfọdụ tụbọrọ dịka ndị ntorobia pụtara n'igwe ebe a na-eme nhọpụta maka emume Big Brother Naija agba nke 2019.
N'ụbọchị Fraide, e mere nhọpụta ahụ n'ebe dị iche iche na Naijiria dịka Abuja, Enugwu, Portharcourt na ebe ndị ọzọ na steeti dị iche iche na Naijira.
Mgbe BBC Igbo na-agba ya ajụjụ ọnụ site n'ekwentị, Carol Ogwuma, ọnụ na-ekwuru Multichoice bụ ndị kpokobara BBNaija bụ kwuru n'ezie n'ihe ahụ mere.
Ogwuma kọwara na ''anyị ma na enwere ndị mmadụ bụ ndị meruru ahụ maọbụ tụbọọ'' n'ihe mmemme ahụ.
Ka osila dị, o kwukwara na-enwere otu ndị gbatagbata na-enye ọgwụ bụ ndị nyeere aka labenye anya na nsogbu ahụ.
Ọtụtụ ndị ntorobia agaala n'ihu ma kwupụta uche ha n'ọnọdụ a n'igwe mgbasa ozi soshal midia.
@Bhadoosky kwuru, ''Maka Chukwu, ahụtụbeghị m ụdịrị ndị ntorobịa si otu a pụta kamgbe m bidoro tụwa vootu. Ọ bụrụ na ha ga-apụta otu a n'ụbọchị Febụwarị 16, 2019. Nke a bụ nhọpụta #BBNaija na Legọs''.
@DrOlufunmilayo kwuru, ''Ọbụrụ na ndị ntorobịa a gaa maka ntụliaka onyeisiala nke afọ 2019 site n'ike na obi ha ji aga #BBNaija, n'ezie anyị gaara achịkọta onwe anyị ọnụ iji wepụta onye ga-enweta mmeri ọkwa onyeisiala''.
Na nke ya AdaJoe kwuru, ''Nhọpụta ihe mmemme big brother na-egosi etu gọọment siri mejọọ ndị ntorobịa. Puku kwụrụ puku ụmụntorobịa nọọrọ na-eme nhọpụta ụbọchị Fraide mgbe ha kwesiri ịnọ n'ụlọakwụkwọ maọbụ n'ụlọọrụ. Abụbọ ọrụ ASUU kana aga n'ihu. Onwekweghị ọrụ dị n'otu aka ahụ''.
Onye ga-enweta mmeri na-afọ ga-enweta ego dịka nde naịra iri atọ na isi (N36million).
Cheta na Miracle Igbokwe si steeti Imo ritara ego dị nde naịra iri anọ na ise (N46milliion) n'ihe mmemme Big Brother Naija nke afọ 2018.
Akụkọ ga-amasị: