You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2019 Elections: Pati APC onweela ngalaba na mba Niger?
Ụmụ Naijiria akatọọla ọbịbịa ndị gọvanọ abụọ si mba Niger bịara Naijira maka achụmta vootu onyeisiala Muhammadu Buhari.
Ụbọchị Tọozde ndị gọvanọ abụọ si mba Niger, wuchiri na Kanọ iji nye achụmta vootu onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari nkwado.
Ndị gọvanọ a gụnyere, Issa Mousa nke steeti Zinder nakwa onye otu ya bụ Zakiri Umar na-achị steeti Maradi.
Onye enyemaka gọvanọ Ụmar Ganduje nke Kano steeti n'okwu mgbasa ozi bụ Salisu Yakasai bụ onye gbara nke a n'anwụ site n'ọba nzikọrịta ozi Twitter ya bụ @dawisu.
Yakasai kwuru, ´´H.E @GovUmarGanduje ya na osote ya H.E Dr Nasiru Gawuna, onye bụbuuru osote ya H.E Prof Hafiz Abubakar, Minista na-ahụ maka ihe na-eme n'ime Abdurrahman Dambazau, nakwa nke na-ahụ maka mmiri, Suleiman Kazaure, ndị Gọvanọ si Zinder na Maradi nke Niger Republic, nakwa ndị ọzọ adịla njikere ịnabata @MBuhari #PMBinKano''.
Onye enyemaka onyeisiala Naijiria n'okwu gbasara social media bụ Bashir Ahmad, site n'ọba nzikọrịta ozi Twitter ya @BashirAhmad kwughachịkwara nke a.
O kwuru, ''Ndị gọvanọ si mba Niger Republic e sonyerela onyeisiala Muhammadu Buhari na mmemme achụmta vootu ya na Kano''.
Na nkọwa ya, onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara mba na mba, bụ Mazi Sam Olisa, katọrọ ọnọdụ a ma kọwaa ya dịka nke na-egosi na Naijiria agaghị enwe ntụliaka mago-mago na a gaghị adị na ya.
na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere site n'ekwe ntị, ''Ọbụrụ na ndị gọvanọ si Niger abịa okwu achụmnta vootu ebe a, nke a na-egosi na ndị ha na-achị nwekwara ike ịbịa tụọ vootu ma oge ruo''.
''O gosikwara na ala Naijiria enweghị ezi nchekwa maka ndọrọndọrọ ọchịchị na-abịa''.
Mazi Olisa gaziri n'ihu ma gwa ndị otu pati na anọghị n'ọchịchị ka ha mụrụ anya ka azụ, gbakwụnye na ''ọnọdụ e metụtala ọgụ Naijiria na-alụ kamgbe megide enweghị nchekwa''.
Na ntụnye ya Mazi Ikechukwu na Twitter kwuru, ''Ndị Gọvanọ si Zinder na Maradi dị na Niger Republic na Ganduje adịla njikere ịnabata #PMBinKano. Ndịọrụ gọọmenti mba Niger nwere ike ịtụ vootu na Nigeria. Anyị ma na ndị Niger na-atụ vootu na mgbago ugwu.
Akụkọ ga-amasị gị: