You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ntuliaka 2019: Buhari anatala akwụkwọ ịzọ ọchịchị n'APC
Onyeisiala Muhammadu Buhari anatala akwụkwọ igosi ebumnobi ya ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ n'okpuru pati APC.
Otu kporo onwe ha National Consolidation Ambassadors Network (NCAN) bụ ndị gbatara ya akwụkwọ ahụ ma wegara ya n'ụlọ ya n'Abuja.
Buhari natara ya bụ akwụkwọ ma katọọ ndị niile na-etinye ọchịchị nke ha tupu nke obodo nke mere ha jiri hapụ pati ha.
Buhari esorola ndị ga-azọ ikike ịzọ ọchịchị ọkwa onyeisiala na 2019 na ntuliaka imeụlọ nke ndị APC ga-eme n'ọnwa.
Cheta na Buhari kwupụtara ebumnobi ya ịzọ ọkwa onyeisiala ọzọ na ntuliaka 2019 na-abịa.
Buhari bara ọchịchị n'afọ 2015 oge ọ natara ọchịchị n'aka ndị pati PDP.