Ọnụ na-ekwuchitere Buhari asabeghi ihe ọbụla gbasara akwụkwọ edemede Ọbasanjọ degaara Buhari

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ka akụkọ edemede onye chịbụrụ Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo degasịrị onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na-ewuewu, mbọ niile BBC Igbo gbara maka ịnụ ihe ndị nọ n'oche ọchịchị ga-ekwu maka okwu a lara iyi n'ihi na ha asaghị.

Dịka ọtụtụ ndị n'ekwenye na akwụkwọ a Obasanjo degara onyeisiala bụ Mohammadu Buhari na ọ bụ ihe ziri ezi, ụfọdụ ndị akatọla ya, kwuo na Obasanjo bụ onye ama ama n'idegara ndị isiala akwụkwọ.

Ugbua ka anyị were ohere a nyocha ihe ndị pụtara ihe na akwụkwọ a nke Obasanjo zigara onyeisiala Buhari nke ọkpọrọ igwu dịna emeghị nkeọma Gọọmenti etiti,

  • Oke Ụnwụ na ụbịam
  • Enweghị nchekwa tara ọchịchị
  • Ahazịghị akụ na ụba nkeọma
  • Mgbahapụ ọrụ dịrị mmadụ
  • Ikpuchi ihe ọjọọ
  • Enweghị ọganihụ na olile anya
  • Enweghị nchịkọta obodo
  • Mmụbanye nke enweghị oke

Mana nke a akwụsịghị ndị mmadụ ikwu obi ha gbasara okwu a ọkachasị Gọvanọ Ekiti bụ Ayọ Fayọse na ụmụ Naịjirịa ndị ọzọ:

Akụkọ a ka ga-abịa.