You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ntuliaka 2019: Buhari ekwuola na ọ ga-azọ ọzọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Onye ndụmọdụ onyeisiala na ihe gbasara ụzọ mgbasaozi ọhụrụ bụ Bashir Ahmad deputara nke a na Twitter.
Nke a ga-akwụsị arụmụka n'ebe dị icheiche ma Buhari ọ ga-azọ ọchịchị ọọ ka ọ bụ na ọ gaghị azọ.
Aka na-achị Kaduna steeti bụ Nasir El-Rufai kwuru na Twitter ya na Buhari kwuru ebumnobi ya n'ọụ̀bakọ ndịisi otu pati APC na-eme ugbua.
A na-etinye ihe ọhụrụ n'akụkọ a mere ugbua mana a ga-egosipụta ya n'uju n'oge nadighị anya. Biko mepegharịa ihuakụkọ a maka akụkọ zuruoke.