Transfer deadline: Nwafọ Naijiria so na ndị akachasị zuo oke ọnụ n'oge a

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu egwu bọọlụ ndị nọ na Premier League mefuru nde narị anọ na iri atọ paunds( £430m) n'January afọ 2018.

Ha mefuru nde otu narị na ise paụnds naanị n'ụbọchị mmechi azụmahia ndị egwu.

Ngalaba na-ahụ maka azụmahịa n'ụlọọrụ Deloitte kwuru na ihe e retara na Jenụwarị afọ bekarịrị ọkara ihe e retara na Jenụwarị afọ 2018.

Nwafọ Naijiria bụ Dominic Solanke so na ndị egwu akacha zụọ oke ọnụ ahịa dịka Liverpool nyefere ya ndị Bournemouth n'ọnụ ego nde paụnds iri na itoolu(£19m)..

Onye egwu bọọlụ bụ Christian Pulisic agalaa Chelsea ka a zụchara ya nde paunds iri ise na asatọ (£58 m).

Newscastle zụrụ Miguel Almiron n'a ndị Atlanta United nde paụnds iri abụọ (£20m)

Lee ka ha si kwụrụ:

Ndị otu Chelsea binyere ndị egwu ha ụfọdụ na mbibi: